Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 16:36 - Bible Nso

36 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri, N'ihi na awusiwo ọla-gi, na n'ihi na ekpughepuru ọtọ-gi site n'ikwa-iko-gi nile i nākwaso ndi nāhu gi n'anya; na n'ihi arusi nile nke ihe-árú-gi nile, na dika ọbara umu-gi si di, nke i nyere ha;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

36 Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Nʼihi na ị wụpụrụ agụụ nke anụ ahụ gị, kpugheekwa ọtọ gị nʼịkwa iko gị nke gị na ndị ị hụrụ nʼanya na-akwa, na nʼihi arụsị gị niile rụrụ arụ, nakwa nʼihi na ị nyere ha ọbara ụmụ gị,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 16:36
22 Iomraidhean Croise  

Ewe meghe anya ha abua, ha we mara na ndi b͕a ọto ka ha bu; ha we dukọta akwukwọ osisi fig, mere onwe-ha ihe-ọkiké.


ha ewuwo kwa ebe nile di elu nke Beal, isure umu-ha ndikom n'ọku ka ha buru àjà-nsure-ọku anāchuru Beal; nke M'nēnyeghi n'iwu, ekwughkwam ya, ọ bataghi kwa n'obim:


Ọzọ, n'ọnu-ọnu-uwe-gi ka achọtaworo ọbara nke nkpuru-obi nke ndi-ob͕eye nēmeghi ihe ọjọ: ọ bughi na ntipú-ulo ka i chọtara ha, kama ọ bu n'ihi ihe ndia nile.


Ọrurú-ya di n'ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-ya; o chetaghi ikpe-azu-ya; O we rida n'uzọ di ebube; ọ dighi onye-nkasi-obi o nwere: Jehova, le nweda-n'alam; n'ihi na onye-iro emewo onwe-ya ka ọ di uku.


N'ihi nka, gi nwanyi nākwa iko, nuru okwu Jehova:


tutu ekpughe ihe ọjọ gi, dika na mb͕e ita-uta nke umu-ndinyom Siria, na nke ndi nile nọ ya buruburu, bú umu-ndinyom nke ndi Filistia, ndi nāzọpia gi buruburu.


ọzọ, mb͕e unu nēbuli onyinye nile unu, mb͕e unu nēme ka umu-unu gabiga n'ọku, ọ̀ bu na unu onwe-unu nēmeru onwe-unu n'arusi nile unu, rue ta? ma Mu onwem, #M'gēkwe ka unu juam ase, ulo Israel? Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), M'gaghi-ekwe ka unu juam ase ma-ọli:


M'gāchusa kwa gi n'etiti mba nile, fesa kwa gi n'ala nile; M'gēme kwa ka iru-árú-gi si nime gi gwusia.


Ndi ahu kpughere ọtọ-ya: umu-ya ndikom na umu-ya ndinyom ka ha chiri, ma ya onwe-ya ka ha jiri mma-agha b͕ue: o we ghọrọ ndinyom aha iji dọ ha aka na nti; ọ bu kwa ihe nile ekpere n'ikpe ka ha mere n'aru ya.


O we kpughe ikwa-iko-ya nile, kpughe kwa ọtọ-ya: nkpuru-obim we kewapu n'aru ya, dika nkpuru-obim si ekewapu n'aru nwa-nne-ya.


ha gēmeso kwa gi n'ikpọ-asì, wepu ihe nile i dọtara n'idọb͕u onwe-gi n'ọlu, ha gārapu kwa gi i b͕arasia ọtọ: agēkpughe kwa ọtọ nke ikwa-iko-gi nile, ma ajọ ihe-nzube-gi ma ikwa-iko-gi nile.


N'ihi na ha akwawo iko, ọbara di kwa n'aka-ha, ọ bu kwa arusi nile ha ka ha kwasoworo iko; ọzọ kwa, umu-ha ndikom, bú ndi ha mutaram, ka ha mere ka ha gabigara ha ọku, ka o we ripia ha.


Ma ikwa-iko-ya nile nke sitere n'Ijipt ka ọ nārapughi; n'ihi na ya na ha dinara mb͕e ọ di na nwata, ndi ahu pi-kwa-ra ọnu-ọnu ara-ya abua aka, bú nke o nwere mb͕e ọ di nāmaghi nwoke: ha we wukwasi ya ikwa-iko-ha dika miri.


N'iru-árú-gi ka ajọ nzube di: n'ihi na emewom ka i di ọcha ma i dighi ọcha, i gaghi-esi kwa n'iru-árú-gi di ọcha ọzọ, rue mb͕e M'gēmewori ka ọnumam zuru ike n'aru gi.


M'we wukwasi ha ọnumam n'ihi ọbara ahu nke ha wukwasiri n'ala-ha, na n'ihi na ha jiri arusi nile ha merua ya:


M'gāwusa kwa unu miri di ọcha, unu ewe di ọcha: ọ bu iru-árú nile unu na arusi nile unu ka M'gēme unu ka unu si nime ha di ọcha.


Ahuhu diri obodo nke nēnupu isi, nke ruwo-kwa-ra árú, obodo ahu nke nēme ihe-ike!


aduam gi ọdú ka i zuru n'akam ọla-edo nke erechaworo n'ọku, ka i we ghọ ọgaranya; ka i zuru kwa uwe ọcha, ka i we bokwasi onwe-gi, ka ewe ghara ime ka ihere nke ib͕a-ọtọ-gi puta ìhè; ka i zuru kwa ọgwu-anya ite n'anya-gi, ka i we nāhu uzọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan