Izikiel 16:27 - Bible Nso27 Ma, le, esetiwom akam imegide gi, M'we bilata òkè nri-gi, rara gi nye n'aka ọchichọ nkpuru-obi ndi nākpọ gi asì, bú umu-ndinyom ndi Filistia, ndi ihere uzọ ajọ nzube gi mere. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a27 Nʼihi ya, esetipụrụ m aka megide gị, e webilatara m oke ala gị ka ọ dị ntakịrị; ewere m gị nyefee oke ọchịchọ nke ndị iro gị, bụ ndị inyom Filistia, ndị ihere mere nʼihi omume gị niile ruru unyi. Faic an caibideil |
N'ihi nka Onye-nwe-ayi agaghi-aṅuri ọṅu n'aru umu-okorọbia-ha, Ọ gaghi-enwe kwa obi-ebere n'aru umu-nb͕ei-ha na ndinyom-ha di-ha nwuru: n'ihi na onye ọ bula nime ha bu onye emeruru emeru na onye nēme ihe ọjọ, ọnu ọ bula nēkwu kwa ihe-nzuzu. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.
Jehova we zìe usu ndi nāpunara madu ihe nke ndi Kaldea, na usu ndi nāpunara madu ihe nke Siria, na usu ndi nāpunara madu ihe nke Moab, na usu ndi nāpunara madu ihe nke umu Amon, imegide ya, o zì-kwa-ra ha imegide Juda ime ka ọ la n'iyì, dika okwu Jehova si di, nke O kwuru site n'aka ndi-orù-Ya, bú ndi-amuma.