O me-kwa-ra ka nwa-ya mwoke gabiga nime ọku, o ji-kwa-ra igwe-oji tu isi ọma na isi ọjọ, ọ b͕a-kwa-ra afa, meso kwa onye nāju mọ ihe, na ndi-dibia-afa: o mere ihe jọrọ njọ n'anya Jehova ri nne, ikpasu Ya iwe.
Onye ahu sure-kwa-ra ihe-nsure-ọku nēsì isì utọ nime ndagwurugwu nwa Hinom, sure kwa umu-ya n'ọku, dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di, bú ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel.
ha ewuwo kwa ebe nile di elu nke Beal, isure umu-ha ndikom n'ọku ka ha buru àjà-nsure-ọku anāchuru Beal; nke M'nēnyeghi n'iwu, ekwughkwam ya, ọ bataghi kwa n'obim:
M'we merua ha n'onyinye nile ha, n'ime ka nwa ọ bula nke nēmeghe àkpà-nwa mbu gabiga n'ọku, ka M'we me ka ha tọb͕ọrọ n'efu, ka ha we mara na Mu onwem bu Jehova.
Agaghi-ahuta n'etiti gi onye nēme ka nwa-ya nwoke ma-ọbu nwa-ya nwayi gabiga nime ọku, ma-ọbu onye nāju ase, ma-ọbu onye nēji igwe-oji tu isi ọma ma-ọbu isi ọjọ, ma-ọbu onye nāb͕a afa, ma-ọbu onye-mb͕asi,