Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 16:12 - Bible Nso

12 M'we tiye nb͕a-aka n'imi-gi, na nb͕a-aka-nti na nti-gi abua, na okpu-eze mara nma n'isi-gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Etinyekwara m gị ọla nʼimi, tinye gị ọlantị abụọ na ntị gị, na okpueze mara mma nʼisi gị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 16:12
13 Iomraidhean Croise  

M'we jua ya, si, Nwa ònye ka i bu? Ọ si, Nwa Betuel ka m'bu, bú nwa Nehoa, onye Milka muru nye ya: m'we tiye nb͕a-aka ahu n'imi-ya, na ọla-aka abua ahu n'aka-ya abua.


Nb͕a-aka ọla-edo na ihe-ichọ-nma nke ọla-edo ọma Ka onye nāba nba nke mara ihe bu na nti nke nānu ihe.


Ntì-gi abua mara nma n'agiri-isi akpara akpa, Olu-gi mara nma n'ihe di oké ọnu-ahia agara aga.


Ihe-ọkpukpa di iche iche nke ọla-edo ka ayi gēmere gi, Ya na nkpọchi ọla-ọcha.


N'ubọchi ahu Jehova nke usu nile nke ndi-agha gāghọrọ ndi-Ya fọduru okpu-eze nke mara nma, na okpu ọma nke ima-nma:


na ihe nile anākwuba na nti, na ọla-aka nile, na ákwà nb͕ochi-iru nile;


na nb͕a-aka-akàrà nile, na nb͕a-aka imi nile;


Si eze, si kwa eze-nwayi, Menu onwe-unu ka unu di ala, nọdunu ala: n'ihi na ihe-isi nile nke unu adapuwo, bú okpu-eze nke ima-nma-unu.


Aha i nwere we pua ba n'etiti mba nile n'ihi nma-gi; n'ihi na ihe zuru okè ka ọ bu, n'ihi ima-nmam nke M'tukwasiri gi; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


I we chiri ihe-gi nile mara nma nke sitere n'ọla-edom na n'ọla-ọcham, nke M'nyere gi, i we mere onwe-gi onyinyo di iche iche nke nwoke, kwaso ha iko,


otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Wezuga ákwà-nkukù-isi ahu, bupu okpu-eze ahu: nka agaghi-abu kwa ihe ọ bu: me ihe nke di ala ka ọ di elu, me kwa ihe nke di elu ka ọ di ala.


Olu ìgwè madu ndi nọ n'udo di kwa nime ya: tukwasi kwa ndikom ndi sitere n'ọra madu, emewo ka ndi nāṅubiga manya ókè si n'ọzara bia; ha we tiye ọla-aka n'aka nke ndinyom ahu, na okpu-eze mara nma n'isi-ha.


M'gēji kwa ubọchi nile nke Bealim leta ya, bú ndi ọ nēsurere ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, chiri nb͕a-aka-imi-ya na ihe-ichọ-nma-ya ke onwe-ya, jeso ndi nāhu ya n'anya, ma Mu ka o chezọrọ; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan