Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 14:7 - Bible Nso

7 N'ihi na onye ọ bula n'ulo Israel, ma-ọbu onye ọ bula nime ndi-ọbìa nke nọ dika ọbìa n'Israel, nke nēkewapu onwe-ya n'isom, we me ka arusi nile ya ba n'obi-ya, nke nētiye kwa ihe-isu-ngọngọ nke ajọ omume-ya na ncherita-iru ya, we biakute onye-amuma iju ase bayerem n'aka ya; Mu onwem, bú Jehova, gāza ya n'Onwem:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 “ ‘Nʼihi na onye ọbụla nʼụlọ Izrel maọbụ onye ọbụla nʼime ndị ọbịa bi nʼala Izrel, nke kewapụrụ onwe ya site nʼiso m, si otu a mee ka arụsị ọ na-efe baa ya nʼobi, nke na-etinye ihe ịsọ ngọngọ ajọ omume nʼihu ha, mechaa, gakwuru onye amụma maka isite nʼaka ya ịjụta m ase, mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ga-azaghachi ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 14:7
24 Iomraidhean Croise  

Ma mb͕e ọbìa gānọ n'ala-gi dika ọbìa, mb͕e ọ gēme-kwa-ra Jehova ememe ngabiga, ka ebìe nwoke ọ bula ọ nwere úgwù, mb͕e ahu ya biarue nso ime ya; ọ gādi kwa ka onye amuru n'ala: ma ọ dighi onye ọ bula anēbighi úgwù gēri ya.


ma ubọchi nke-asa bu ubọchi-izu-ike nke Jehova, bú Chineke-gi, nwere: i gaghi-eje ozi ọ bula nime ya, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na anu-ulo-gi, na ọbìa-gi nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula:


Jehova, n'ìhi gini ka I nēme ka ayi si n'uzọ-Gi nile kpafue? n'ìhi gini ka I nēme ka obi-ayi si n'egwu-Gi sie ike? Lata n'ihi ndi-orù-Gi, bú ebo nile nke ihe-nketa-Gi.


eze, bú Zedekaia, we ziga, kuta ya: eze we jua ya n'ulo-ya na nzuzo, si, Ọ̀ di okwu ọ bula sitere na Jehova? Jeremaia we si, Okwu di. O we si, N'aka eze Babilon ka agēnye gi.


Ọzọ, mb͕e onye ezi omume si n'ezi omume-ya chigharia, we me ajọ omume, M'we tiye ihe-isu-ngọngọ n'iru ya, onye ahu gānwu; n'ihi na i dọghi ya aka na nti, ọ bu na nmehie-ya ka ọ gānwu, agaghi-echeta kwa ezi omume-ya nile nke o meworo; ma n'aka-gi ka M'gājuta ọbara-ya.


M'gaghi-eji nmehie-ha leta umu-unu ndinyom mb͕e ha nākwa iko, M'gāghi-eji kwa nmehie-ha leta ndinyom unu luworo ọhu mb͕e ha nākwa iko; n'ihi na ha onwe-ha nēwezuga onwe-ha so ndinyom nākwa iko, ha nēso kwa ndinyom edoro nsọ ikwa iko chua àjà: ma ndi ọ bula nke nādighi-aghọta ka agākwatu n'ala.


I gāsu kwa ngọngọ n'ehihie, ọzọ, onye-amuma gēso kwa gi su ngọngọ n'abali; M'gēme kwa ka nne-gi la n'iyì.


Dika nkpuru-vine n'ọzara ka M'chọtara Israel; dika nkpuru nke buru uzọ cha n'osisi fig n'oge mbu ya ka M'huru nna-unu-hà: ma ha onwe-ha biakutere Beal-peoa, kewaputa onwe-ha nye ihere ahu, ghọ ihe-árú dika ihe ahu ha huru n'anya.


Ọ gābu-kwa-ra unu ukpuru ebighi-ebi: n'ọnwa nke-asa, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu, unu gēweda nkpuru-obi-unu n'ala, ghara kwa ije ozi ọ bula, ma ọ bu onye amuru n'ala, ma-ọbu ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti unu:


I gāsi kwa umu Israel, Nwoke ọ bula n'etiti umu Israel, ma-ọbu n'etiti ndi-ọbìa ndi nọ dika ọbìa n'Israel, nke nēnye Molek otù nwa nime nkpuru-ya: aghaghi ime ka ọ nwua: ndi ala-unu gēwere nkume tub͕ue ya.


Otù ikpé diri unu, dika anēkpe ọbìa, otú a ka agēkpe onye amuru n'ala: n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.


Nime nkpọkọta nka, otù ukpuru diri unu, di-kwa-ra ọbìa nke nọ dika ọbìa, bú ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ nile unu: dika unu si di, otú a ka ọbìa ahu gādi n'iru Jehova.


Ma onye amuru n'ala n'etiti umu Israel, ma ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti ha, otù iwu ka unu gēnwe bayere onye nēme ihe n'amaghi-ama.


o we rue, mb͕e ọ gānu okwu nile nke ọb͕ub͕a-iyi a, na ọ gāgọzi onwe-ya n'obi-ya, si, Udo ka m'gēnwe, ọ bu ezie na n'isi-ike nke obim ka m'nēje ije, ka m'we were iṅubiga-ihe-okè tukwasi n'akpiri-ikpọ-nku:


Ndia bu ndi nākpata nkewa, ndi nkpuru-obi madu nāchi, ndi nēnweghi Mọ Nsọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan