Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 14:22 - Bible Nso

22 Ma, le, ndi b͕apuru ab͕apu gāfọdu nime ya, ndi anēme ka ha puta, bú umu-ndikom na umu-ndinyom: le, ha nāpukute unu, unu gāhu kwa uzọ-ha na omume nile ha: ewe kasie unu obi bayere ihe ọjọ ahu nke M'meworo ka ọ biakwasi Jerusalem, bú ihe ahu nile nke M'meworo Ka ọ biakwasi ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Ma a ga-enweta ụfọdụ ndị ga-afọdụ ndụ, bụ ụmụ unu ndị nwoke na ndị nwanyị, ndị a ga-anapụta site nʼahụhụ ndị a. Ha ga-abịakwute unu. Mgbe unu hụrụ omume ha, na obibi ndụ ha, ha ga-abụrụ unu ihe nkasiobi nʼihi na unu ga-esite na ha mata ụdị mbibi nke m mere ka ọ bịakwasị Jerusalem.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 14:22
27 Iomraidhean Croise  

O me ndi fọduru site na mma-agha ka ha je biri na Babilon; ha we ghọrọ ya, ghọ-kwa-ra umu-ya, ndi-orù rue ọbubu-eze ala-eze Peasia:


N'ihi na otú a ka ọ gādi n'etiti uwa n'etiti ndi nile, dika ntisisi nke osisi olive, dika nkpuru nke fọduru itutukọ, mb͕e ọghughọ-nkpuru-vine gwusiworo.


Ma ọ buru na otù uzọ n'uzọ iri afọdu nime ya, aghaghi irechapu kwa ya ọzọ: dika osisi terebinth, na dika osisi oak, nke ogwe fọduru ha mb͕e eb͕utusiri ha; nkpuru nsọ bu ogwe-ya.


N'ihi na gi ka M'nọyere, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), izọputa gi: n'ihi na M'gēme ka mba nile gwusia, bú ebe M'chusaworo gi, ma otú ọ di, gi ka M'nāgaghi-eme ka i gwusia: ma M'gādọ gi aka na nti n'ikpé, M'gaghi-asi kwa na i bu onye ikpe nāmaghi ma-ọli.


N'ihi na otú a ka Jehova siri, Ebe tọb͕ọrọ n'efu ka ala nka nile gābu; ma M'gaghi-eme ka ọ gwusia.


Ọ gēru kwam mb͕e unu gāsi, N'ìhi gini ka Jehova, bú Chineke-ayi, meworo ayi ihe nile ndia? na i gāsi ha, Dika unu rapurum, we fè chi di iche iche nke ala ọzọ n'ala-unu, otú a ka unu gēfè ndi ala ọzọ n'ala nābughi nke unu.


Ma M'gēme ka ndikom ole-na-ole nime ha fọdu pua na mma-agha, na n'oké unwu, na n'ajọ ọria nēfe efe; ka ha we kọ akukọ ihe-árú nile ha n'etiti mba nile ebe ha gābiawori; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.


Ka i we būru ọnọdu-ihere-gi, ka ihere we me kwa gi n'ihi ihe nile nke i meworo, n'ikasi ha obi.


ka i we cheta, ihere ewe me gi, i we ghara isaghe kwa ọnu-gi ọzọ ma-ọli, n'ihi ihere-gi; mb͕e M'gēkpuchiworo gi-ri ihe nile i meworo; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Unu gēcheta kwa n'ebe ahu uzọ nile unu, na omume nile unu, nke unu meruru onwe-unu nime ha; unu gāsọ kwa onwe-unu oyi n'iru unu n'ihi ihe ọjọ nile unu nke unu meworo.


Emerem ka mba nile me nkpatu site n'olu nke ọdida-ya, mb͕e M'mere ka ọ ridarue ala-mọ, ya na ndi nārida n'olùlù: ewe kasie osisi nile nke Iden obi n'ala di n'okpuru uwa, bú osisi arọputara arọputa kachasi kwa nma na Lebanon, ndi nile nke nāṅu miri.


Ndi ahu ka Fero gāhu, ewe kasie ya obi bayere ìgwè ndi-ya nile: ha bu ndi ejiri mma-agha b͕u, bú Fero na usu-ndi-agha-ya nile; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Ha we biarue mba nile ebe ha biara, ha we me ka aha nsọm ghara idi nsọ; mb͕e anēkwu okwu bayere ha, si, Ndi nke Jehova ka ndia bu, ọ bu kwa n'ala-Ya ka ha siri puta.


Unu gēcheta kwa uzọ ọjọ nile unu, na omume nile unu nke nādighi nma; unu gāsọ kwa onwe-unu oyi n'anya-unu n'ihi ajọ omume nile unu na n'ihi ihe-árú nile unu.


Ma ndi-ha b͕apuru ab͕apu gāb͕apu, nọ n'ugwu nile dika nduru nke ndagwurugwu, ha nile nēkwo ákwá, onye ọ bula n'ajọ omume-ya.


Ndi Jekob fọduru gādi kwa n'etiti ọtutu ndi di iche iche dika igirigi sitere n'ebe Jehova nọ, dika aburubu-miri n'elu ihe-ọkukú; nke nādighi-ele anya onye ọ bula, nke nādighi-echere kwa umu madu.


Ọ buru kwa na Onye-nwe-ayi emeghi ubọchi ahu ka ha di nkpirikpi, agaghi-azọputa madu ọ bula: ma n'ihi ndi arọputara, ndi Ọ rọputara, O mere ka ubọchi ahu di nkpirikpi.


n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, bu Chineke nwere obi-ebere; Ọ gaghi-ara gi aka, Ọ gaghi-ebibi kwa gi, Ọ gaghi-echezọ kwa ọb͕ub͕a-ndu nke nna-gi-hà, nke Ọ ṅuru ha iyi bayere ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan