Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 14:18 - Bible Nso

18 asi na ndikom atọ ndia nọ n'etiti ya, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), ha agaghi-anaputa umu-ndikom na umu-ndinyom, kama ha onwe-ha, nání ha, ka agānaputa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 dịka m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, a sịkwarị na ndị ikom atọ ndị a nọ nʼala ahụ, ha agaghị anapụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom site nʼịla nʼiyi. Kama, ọ bụ naanị ha onwe ha ka a ga-anapụta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 14:18
6 Iomraidhean Croise  

Ma ọ buru na ndi-amuma ka ha bu, ọ buru na okwa na okwu Jehova di ha n'ọnu, biko, ka ha riọ Jehova nke usu nile nke ndi-agha aririọ, ka ihe nile nke fọduru n'ulo Jehova, na n'ulo eze Juda, na nime Jerusalem, we ghara ibà na Babilon.


Ha gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'gāchusa ha n'etiti mba nile, fesa kwa ha n'ala nile.


asi na ndikom atọ ndia, bú Noa na Daniel na Job, nọ n'etiti ya, ha onwe-ha gēji ezi omume-ha naputa nání nkpuru-obi-ha; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


asi na ndikom atọ ndia nọ n'etiti ya, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), ọ dighi umu-ndikom ọ dighi kwa umu-ndinyom ha gānaputa ma-ọli; ha onwe-ha, nání ha, ka agānaputa, ma ala ahu gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu.


Ma-ọbu, asi na ọ bu mma-agha ka M'nēme ka ọ biakwasi ala ahu, M'we si, Ka mma-agha gabiga n'ala nka; M'we bipu madu na anumanu nime ya;


Ma-ọbu asi na ọ bu ajọ ọria nēfe efe ka M'nēziga n'ala ahu, M'we wukwasi ya ọnumam n'ọbara, ibipu madu na anumanu nime ya:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan