Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 13:8 - Bible Nso

8 N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: N'ihi na unu ekwuwo okwu efu, hu ọhù ugha, n'ihi nka, le, Mu nēmegide unu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 “ ‘Nʼihi ya, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, aga m ebibi unu nʼihi okwu ụgha na ọhụ ụgha unu niile. Edoola m onwe m imegide unu, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 13:8
21 Iomraidhean Croise  

Ọ si ya, Mu onwem bu kwa onye-amuma dika gi; mọ-ozi we gwam okwu n'okwu Jehova, si, Me ka o soro gi lata n'ulo-gi, ka o we rie nri ṅu kwa miri. Ma ọ gwara ya okwu-ugha.


Le, Mu nēmegide gi, gi nwayi bi na ndagwurugwu, gi oké nkume nke ebe di lari, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); unu ndi nāsi, Ònye gāridata imegide ayi? ma-ọbu ònye gābata n'ebe-obibi nile ayi?


N'ihi nka, le, Mu nēmegide ndi-amuma, (ọbu ihe si n'ọnu Jehova puta), bú ndi nēzu okwum nile n'ori, onye ọ bula n'aka ibe-ya.


Zigara ndi nile emere ka ha je biri n'ala ọzọ, si, Okwu di otú a ka Jehova kwuru bayere Shemaia onye-Nehelamait, si: N'ihi na Shemaia ebuworo unu amuma, ma Mu onwem eziteghi ya, o we me ka unu tukwasi okwu-ugha obi;


Le, Mu nēmegide gi, gi ugwu nēbibi ebibi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), nke nēbibi uwa nile: M'gēseti kwa akam imegide gi, kpọreda gi site na nkume-gi nile di elu, mee ka i ghọ ugwu esurere esure.


si ala Israel, Otú a ka Jehova siri: Le, Mu nēmegide gi, M'gāmiputa kwa mma-agham n'ọbọ-ya, bipu nime gi onye ezi omume na onye nēmebi iwu.


n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, Mu nēmegide gi, Taia, M'gēme kwa ka ọtutu mba rigota imegide gi, dika oké osimiri si eme ka nmali-miri-ya nile rigota.


si, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu nēmegide gi, Zaidon; ewe sọpurum n'etiti gi: ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'mesiri nime ya ihe nile ekpere n'ikpe, ewe dom nsọ nime ya.


N'ihi nka, le, Mu nēmegide gi, megide kwa osimiri Nail i nile, M'gēme kwa ka ala Ijipt ghọ nání nkpọnkpọ ebe nkpọnkpọ ebe na ebe tọb͕ọrọ n'efu, site na Migdol rue Sevene, ọbuná rue ókè-ala Etiopia.


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu onwem nēmegide ndi-ọzùzù-aturu; M'gājuta kwa ìgwè ewu na aturu nkem n'aka-ha, me ka ha kwusi izù ìgwè ewu na aturu ahu; ndi-ọzùzù-aturu agaghi-azù kwa onwe-ha ọzọ; M'gānaputa kwa ìgwè ewu na aturu nkem n'ọnu-ha, ka ha we ghara ighọrọ ha ihe-oriri.


si ya, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu onwem nēmegide gi, ugwu Sia, M'gēseti kwa akam imegide gi, M'gēme kwa ka i ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu na ihe-iju-anya.


Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, bue amuma megide Gog, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu onwem nēmegide gi, Gog, onye-isi nke Rosh na nke Meshek na nke Tubal:


n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, Mu nēmegide gi, ọbuná Mu onwem; M'gēme kwa ihe nile nke ekpere n'ikpe n'etiti gi n'anya mba nile.


Le, Mu nēmegide gi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), M'gēsure kwa ub͕ọ-ala-ya n'anwuru-ọku, ọ bu kwa umu-ọdum-i ka mma-agha gēripia: M'gēbipu kwa anu-ndọb͕u-gi n'uwa, agaghi-anu kwa olu ndi-ozi-gi ọzọ.


Ma Mọ Nsọ nēkwuwa okwu, si, na n'oge ikpe-azu ufọdu gēwezuga onwe-ha n'ebe okwukwe-ayi di, nāṅa nti ndi-mọ nēduhie eduhie na ozizí nke ndi-mọ ọjọ,


n'ihi na ọnwunwa nke aru bara urù nye ihe ntà; ma nsọpuru-Chineke bara urù nye ihe nile, ebe o nwere nkwa nke ndu, ma nke ndu ub͕u a, ma nke gaje ibia.


N'ihi na anya abua nke Onye-nwe-ayi di n'aru ndi ezi omume, Nti-Ya abua di kwa n'ebe aririọ-ha di: Ma iru nke Onye-nwe-ayi digidere ndi nēme ihe ọjọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan