Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 13:23 - Bible Nso

23 n'ihi nka unu agaghi-ahu kwa ọhù efu ọzọ, unu agaghi-aju kwa ase ọzọ: M'gānaputa kwa ndim n'aka-unu; unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Nʼihi nke a, unu agaghị ahụkwa ọhụ ụgha ọzọ, maọbụ gbaa afa. M ga-anapụta ndị nke m site nʼaka unu. Mgbe ahụ unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 13:23
20 Iomraidhean Croise  

Ọzọ, n'aru ndi-amuma Jerusalem ka M'huworo ihe jọb͕uru onwe-ya; ha nākwa iko, nējeghari kwa n'okwu-ugha, ha emewo kwa ka aka ndi nēme ihe ọjọ di ike, ha we ghara isi, onye ọ bula n'ihe ọjọ ya, lata: ha nile aghọworom ihe di ka Sọdọm, ndi bi nime ya aghọwo-kwa-ram ihe di ka Gọmọra.


N'ihi na ọhù efu ọ bula, ma-ọbu iju-ase ire-utọ, agaghi-adi kwa n'etiti ulo Israel.


M'gādọwa kwa ákwà-nb͕okwasi nile unu, naputa ndim n'aka-unu, ha agaghi-adi kwa n'aka-unu ọzọ ichu ntá ha; unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.


M'gēdo kwa irum megide onye ahu, me ya ka ọ buru ihe-iju-anya, ka ọ ghọ ihe-iriba-ama na ilu, M'gēbipu kwa ya n'etiti ndim; unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.


M'gēche kwa irum imegide ha; ọku ka ha siworo puta, ma ọku gēripia ha; unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'doro irum imegide ha.


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu onwem nēmegide ndi-ọzùzù-aturu; M'gājuta kwa ìgwè ewu na aturu nkem n'aka-ha, me ka ha kwusi izù ìgwè ewu na aturu ahu; ndi-ọzùzù-aturu agaghi-azù kwa onwe-ha ọzọ; M'gānaputa kwa ìgwè ewu na aturu nkem n'ọnu-ha, ka ha we ghara ighọrọ ha ihe-oriri.


N'ihi nka ka abali gādiri unu, unu ewe ghara ihu ọhù; ọchichiri gāb͕a-kwa-ra unu, unu ewe ghara iju ase; anyanwu gādakpute kwa ndi-amuma ahu, ubọchi ewe ji nji n'elu ha.


Ọ gēru kwa, mb͕e onye ọ bula gēbu kwa amuma ọzọ, na nna-ya na nne-ya ndi muru ya gāsi ya, I gaghi-adi ndu; n'ihi na okwu-ugha ka i kwuworo n'aha Jehova: nna-ya na nne-ya ndi muru ya gāmapú ya mb͕e o nēbu amuma.


N'ihi na Kraist ugha di iche iche na ndi-amuma ugha gēbili, gosi kwa ihe-iriba-ama uku di iche iche na ọlu-ebube uku di iche iche; iduhie ọbuná ndi arọputara, ma ọ buru na ọ gēkwe me.


n'ihi na Kraist ugha di iche iche na ndi-amuma ugha gēbili, gosi kwa ihe-iriba-ama di iche iche na ọlu-ebube di iche iche, ka ha we duhie ndi arọputara, ma ọ buru na ọ gēkwe me.


N'ihi na irọ-òtù di iche iche aghaghi idi kwa n'etiti unu, ka ndi anwaputaworo we ghọ ndi putara ìhè n'etiti unu.


Ma onye-amuma nke gēwere nganga kwu okwu n'aham, nke M'nēnyeghi ya iwu ikwu, ma-ọbu nke gēkwu n'aha chi di iche iche ọzọ, onye-amuma ahu gānwu kwa.


Ma ha agaghi-aga n'iru kari: n'ihi na enweghi-uche-ha gāputasi ìhè nye madu nile, dika enweghi-uche nke ndi ahu putakwara.


Ma Onye ahu nke puru iche unu nche ka unu ghara isu ngọngọ, na iguzo unu n'iru ebube-Ya nādighi ita uta n'oké obi-utọ,


Ndi ahu we merie ya n'ihi ọbara Nwa-aturu ahu, na n'ihi okwu àmà-ha; ha ahughi kwa ndu-ha n'anya rue ọnwu.


Ewe chudà dragon uku ahu, bú agwọ ochie ahu, onye anākpọ Ekwensu na Setan, onye nēduhie uwa nile madu bi; achudara ya n'uwa, chudà kwa ndi-mọ-ozi-ya, ha na ya.


ewe nye ya ọnu nke nēkwu oké ihe n'ikwulu Chineke; ewe nye ya ike ime omume-ya ọgu ọnwa abua na abua.


Ndi nile ndi bi n'elu uwa gākpọ kwa isi ala nye ya, onye ọ bula anēdeghi aha-ya n'akwukwọ nke ndu nke Nwa-aturu ahu Onye eb͕uworo site n'oge itọ ntọ-ala nke uwa.


M'we hu dika agāsi na ọ bu oké osimiri eji enyo me nke agwakọworo ya na ọku; ahu-kwa-ram ndi nāputa n'aka anu-ọhia ahu na nmeri, ya na n'aka ihe-oyiyi-ya, na n'aka ọnu-ọgugu aha-ya, ka ha nēguzo n'usọ oké osimiri ahu eji enyo me, nēnwe ubọ-akwara nke Chineke.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan