Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 13:10 - Bible Nso

10 N'ihi na, ọ bu n'ihi na ha ewezugawo ndim, si, Udo; ma udo adighi; ndim ahu nālu kwa mb͕idi nādighi ike, ma, le, ha nēte ya nzu:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 “ ‘Nʼihi na ha eduhiela ndị m, mgbe ha na-asị, “Udo,” ebe udo na-adịghị, nʼihi na mgbe e wuru mgbidi na-esighị ike, ndị amụma ndị a jara ha mma, werekwa nzu techie ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 13:10
27 Iomraidhean Croise  

Ma ha anugh: Manase we me ka ha sihie uzọ ime ihe ọjọ kari mba ọzọ, bú ndi Jehova kpochapuru n'iru umu Israel.


Ma onye-ozi ahu nke jere ikpọ Maikaia gwara ya okwu, si, Le, okwu nile nke ndi-amuma, dika otù ọnu, nēkwuru eze ezi ihe: biko, ka okwu-gi di kwa ka okwu otù onye nime ha, gi kwu kwa ezi ihe.


Onye ezi omume nēgosi madu-ibe-ya uzọ: Ma uzọ ndi nēmebi iwu nēme ka ha kpafue.


ndi siworo ndi-ọhu-uzọ, Unu agaghi-ahu uzọ; ndi siwo-kwa-ra ndi-ọhù, Unu agaghi-ahuru ayi ihe ziri ezi n'ọhù-unu, gwanu ayi okwu ire-utọ nile, hunu ihe-ikwa-emò n'ọhù-unu:


Ọ dighi udo ndi nēmebi iwu nwere, ka Chinekem siri.


M'we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! le, ndi-amuma nāsi ha, Unu agaghi-ahu mma-agha, unu agaghi-enwe kwa oké unwu; kama udo nke ezi-okwu ka M'gēnye unu n'ebe a.


Ha nọ nāsi ndi nēlelìm, Jehova ekwuwo okwu, si, Udo gādiri unu; ọ bu kwa onye ọ bula nke nējeghari n'isi-ike nke obi-ya ka ha siworo, Ihe ọjọ agaghi-abiakwasi unu.


Le, Mu nēmegide ndi nēbu amuma nrọ ugha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ha we ze ha, me ka ndim kpafue site n'okwu-ugha nile ha na n'obi-ha nādighi n'otù ebe: ma Mu onwem eziteghi ha, enyeghkwam ha iwu; ọ dighi kwa urù ha gābara ndi nka ma-ọli; ọ bu ihe si n'onu Jehova puta.


Onye-amuma nke nēbu amuma bayere udo, mb͕e okwu onye-amuma ahu gērè, agāmara onye-amuma ahu, na Jehova ezitewo ya n'ezie.


M'we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! n'ezie I rafuwo ndi nka na Jerusalem nke-uku, si, Udo gādiri unu, ma mma-agha emetuwo nkpuru-obi aru.


ndi-amuma ebuwo amuma ugha, ndi-nchu-àjà nāzọda kwa ndim site n'aka-ha; ndim ahuwo kwa ihe di otú a n'anya: ma gini ka unu gēme n'ikpe-azu-ya?


Ìgwè ewu na aturu nāla n'iyì ka ndim buworo: ndi-ọzùzù-aturu-ha emewo ka ha kpafue, n'ugwu di iche iche ka ha meworo ka ha laghachi azu: site n'ugwu rue ugwu ntà ka ha jeworo, ha echezọwo ebe-nmakpu-ha.


Ha we gwọ nb͕aji ukwu na aka nke ndim nākpọghi ya ihe, si, Udo, udo; mb͕e udo nādighi.


Ha we gwọ nb͕aji ukwu na aka nke ada ndim nākpọghi ya ihe, si, Udo, udo; mb͕e udo nādighi.


Ayi lere anya udo, ma ọ dighi ezi ihe biara; ayi lere anya mb͕e ọgwugwọ, ma le, oké egwu.


bú ndi-amuma Israel ndi nēbu amuma bayere Jerusalem, ndi nāhu-kwa-ra ya ọhù udo, ma udo adighi; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Ọzọ, ndi-amuma-ya eteworo ha nzu, nāhu ọhù efu, nāju-kwa-ra ha ase okwu-ugha, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri, ma Jehova ekwughi okwu.


Nkpà abiawo; ha gāchọ kwa udo, ma ọ dighi.


Ubọchi nile nke nleta abiawo, ubọchi nkwughachi abiawo; Israel gāma ya: onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ka onye-amuma bu, onye-ara ka onye nwere Mọ Chineke bu, n'ihi iba-uba nke ajọ omume-gi, na n'ihi na ihe bara uba ka ikpọ-asì ahu bu.


Ọ buru na onye ọ bula nke nējeghari n'ifufe na okwu-ugha ekwu okwu-ugha, si, M'gābusara gi okwu dika miri bayere manya-vine, baye-kwa-ra ihe-ọṅuṅu nāba n'anya; ọ gābu kwa onye nābusara ndi nka okwu dika miri.


Ma uḅu a ayi onwe-ayi nākpọ ndi-nganga ndi ihe nāgara nke-ọma; e, anēwu ndi nēme ihe-nmebi-iwu dika ulo; e, ha anwawo Chineke, ewe me ka ha wepuga onwe-ha.


Mb͕e ha nāsi, Udo na ntukwasi-obi di, mb͕e ahu na mberede ka nbili nābiakwasi ha, dika ime nēme nwanyi nke di ime; ha agaghi-ab͕anari kwa ya ma-ọli.


Ma Mọ Nsọ nēkwuwa okwu, si, na n'oge ikpe-azu ufọdu gēwezuga onwe-ha n'ebe okwukwe-ayi di, nāṅa nti ndi-mọ nēduhie eduhie na ozizí nke ndi-mọ ọjọ,


Ma ajọ madu nile na ndi-aghughọ gānaga n'iru n'ijọkari njọ, nēduhie ndi ọzọ, anēduhie kwa ha.


Ihe ndia ka m'degara unu n'akwukwọ bayere ndi nēduhie unu.


Ma enwerem nka imegide gi, na i kwere nwanyi ahu, bú Jezebel, onye nākpọ onwe-ya onye-amuma-nwanyi; o nēzí kwa ndi-orùm ihe, nēduhie kwa ha, ka ha kwa iko, ri kwa ihe achuru n'àjà nye arusi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan