Ma eze Israel na Jehoshafat, bú eze Juda, nānọkwasi, nwoke ọ bula n'oche-eze-ya, yiri uwe-ha, n'ebe-nzọcha-ọka n'oghere ọnu-uzọ-ama Sameria; ndi-amuma nile nēbu kwa amuma n'iru ha.
N'ihi nka si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ dighi okwu ọ bula n'okwum nile agēme kwa ka ọ di anya ọzọ, ma okwu nke M'gēkwu, agēme kwa ya; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.