26 Okwu Jehova we ruem nti, si,
26 Okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere m,
Gi onwe-gi arapuwo Mu onwem, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), azu ka i nālaghachi: M'we setipu akam imegide gi, we bibie gi; ike ncheghari agwusiwom.
N'ihi na Mu onwem bu Jehova; M'gēkwu okwu, okwu nke M'gēkwu, agēme kwa ya; agaghi-eme kwa ya ka ọ di anya ọzọ: n'ihi na n'ubọchi-unu, unu ulo nke nnupu-isi, ka M'gēkwu okwu, me ya; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
Nwa nke madu, le, ulo Israel nāsi, Ọhù ahu nke ya onwe-ya nāhu diri ọtutu ubọchi di n'iru, ọ bu kwa mb͕e di anya ka ya onwe-ya nēburu amuma.