Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 12:20 - Bible Nso

20 Agēme kwa ka obodo-ya nile ebi ebi ghọ nkpọnkpọ ebe, ala gābu kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu, unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Obodo niile nke ndị mmadụ bi nʼime ya ga-ala nʼiyi, otu aka ahụ, ala unu niile ga-abụ ebe tọgbọrọ na nkịtị. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe bụ Onyenwe anyị.’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 12:20
23 Iomraidhean Croise  

Nke fọduru n'obodo bu ebe tọb͕ọrọ n'efu, ọ bu kwa ntikpọ ka eji tie ọnu-uzọ-ama.


Agāb͕abasi uwa ọtọ, lutasia ya n'agha; n'ihi na Jehova ekwuwo okwu a.


Ọnu-uzọ-ya nile gēze ume, ru kwa újú; agēme kwa ka ọ tọb͕ọrọ n'efu, ọ gānọdu n'ala.


N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Le, M'gaje ime ka olu nke obi-utọ na olu ọṅù na olu nwoke nālu nwunye ọhu na olu nwanyi anālu ọhu kwusi n'ebe a n'anya-unu na n'ubọchi-unu.


i gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ọbuna otú a ka M'gētiwa ndi nka na obodo a, dika madu si etiwa ite ọkpu-ite, nke anāpughi imezi kwa ya ọzọ: ọ bu kwa na Tofet ka ha gēlì ozu, n'ihi na ebe ilì ozu adighi.


le, M'gaje iziga chiri ab͕uru nile nke Ugwu, (ọ̀ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ọ bu kwa Nebukadreza, bú eze Babilon, bú orùm, ka M'gēzigara ozi, M'gēme kwa ka ha bia imegide ala nka, na imegide ndi bi ya, na imegide mba nile ndia nọ ya buruburu; M'gēwezuga kwa ha ka ebibie ha, M'gēme kwa ha ka ha ghọ ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ, na nkpọnkpọ ebe di mb͕e ebighi-ebi.


Le, M'gaje inye iwu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), me ka ha biaghachi n'obodo a; ha gēbuso kwa ya agha, were ya, sure ya n'ọku: ọ bu kwa obodo nile nke Juda ka M'gēme ka ha ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ghara inwe onye-obibi.


Ọdum esiwo n'alughi-ulù-ya rigo, bú onye nēbibi mba di iche iche; o buliwo ije-ya, o siwo n'ọnọdu-ya puta; ime ka ala-gi ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu; obodo-gi nile gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ghara inwe onye-obibi.


N'ihi ugwu Zaion, nke tọb͕ọrọ n'efu; Nkita-ọhia ejeghariwo na ya.


Ha gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'gāchusa ha n'etiti mba nile, fesa kwa ha n'ala nile.


Okwu Jehova we ruem nti, si,


N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: dika osisi vine si di n'etiti osisi oké ọhia, nke M'nyeworo ọku ibu nri-ya, otú a ka M'nyeworo ndi bi na Jerusalem.


M'gēme kwa ka ala-ha ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, n'ihi na ha emekpuwo ihe-nmekpu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


n'ihi nka bue amuma, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na, ọbuná n'ihi na ha emewo ka unu tọb͕ọrọ n'efu, na n'ihi na ha eledawo unu buruburu, ka unu we ghọrọ mba nile fọdurunu ihe-nnweta, ewe me ka unu rigokwasi n'eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi-ire, buru akukọ ọjọ nke ndi-unu:


Ọzọ, M'gēme gi ka i ghọ nkpọnkpọ ebe na ihe-ita-uta, n'etiti mba nile nke di gi buruburu, n'anya onye ọ bula nke nāgabiga.


Ma ub͕u a, Chineke-ayi, ge nti n'ekpere orù-Gi na n'aririọ-amara-ya nile, me iru-Gi ka ọ mukwasi ebe nsọ Gi nke tọb͕ọrọ n'efu, n'ihi Onye-nwe-ayi.


M'gēme obodo nile unu nkpọnkpọ ebe, me kwa ebe nsọ unu ka ha tọb͕ọrọ n'efu, M'gaghi-anu kwa ísì utọ unu.


Unu ka M'gēfesa kwa n'etiti mba nile, M'gāmipu kwa mma-agha chua unu n'azu: ala-unu gābu kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu, obodo-unu nile gābu kwa nkpọnkpọ ebe.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan