Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 12:14 - Bible Nso

14 Ọ bu kwa ndi nile ndi di ya buruburu iyere ya aka, na usu-ndi-agha-ya nile, ka M'gēfesara ifufe nile ọ bula; ọ bu kwa mma-agha ka M'gāmiputa n'azu ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Ndị niile gbara ya gburugburu na ndị agha ya niile ka m ga-achụsa nʼala niile, ọ bụkwa mma agha ka m ga-amịpụta jiri chụọ ha ọsọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 12:14
10 Iomraidhean Croise  

ọ gēru kwa, na mma-agha ahu nke unu onwe-unu nātu egwu ya, n'ebe ahu ka ọ gēru unu aru n'ala Ijipt; ọzọ, oké unwu ahu, nke unu onwe-unu nātu egwu ya, n'ebe ahu ka ọ gārapara unu n'aru n'iso unu n'azu n'Ijipt; ọ bu kwa n'ebe ahu ka unu gānwu.


Ma ub͕u a maranu nke-ọma na ọ bu site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe, ka unu gānwu n'ebe ahu nke ọ nātọ unu utọ ije nọ dika ọbìa n'ebe ahu.


Camel nile ha gāghọ kwa ihe-nluta-n'agha, ìgwè anumanu-ha gāghọ kwa ihe-nkwata: M'gēfesa-kwa-ra ifufe nile ndi akọpuworo usọ isi-ha; ọ bu kwa n'ofè-ya nile ka M'gēme ka nhuju-anya-ha si bia; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ma-ọbu, asi na ọ bu mma-agha ka M'nēme ka ọ biakwasi ala ahu, M'we si, Ka mma-agha gabiga n'ala nka; M'we bipu madu na anumanu nime ya;


N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Àgēsi kwa aṅa naputa ya ma-ọli mb͕e ọ bu ikpém anọ jọrọ njọ, bú mma-agha na oké unwu na ajọ anu-ọhia na ajọ ọria nēfe efe, ka M'zigara na Jerusalem, ibipu madu na anumanu nime ya?


Ma ndi-ya nile ndi b͕alagara ab͕alaga n'usu-ndi-agha-ya nile gāda site na mma-agha, ndi fọduru gāb͕asa-kwa-ra ifufe nile ọ bula: unu ewe mara na Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo.


Otù uzọ n'uzọ atọ ka i gēji ọku sure n'etiti obodo ahu, mb͕e ubọchi nile nke nnọchigide-n'agha ahu zuru ezu; i gēwere kwa otù uzọ n'uzọ atọ, were mma-agha ahu tie ya buruburu obodo ahu; otù uzọ n'uzọ atọ ka i gēfesara ifufe, ọ bu kwa mma-agha ka M'gāmiputa n'azu ha.


Unu ka M'gēfesa kwa n'etiti mba nile, M'gāmipu kwa mma-agha chua unu n'azu: ala-unu gābu kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu, obodo-unu nile gābu kwa nkpọnkpọ ebe.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan