Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 11:9 - Bible Nso

9 M'gēme kwa ka unu si n'etiti ya puta, M'gēnye kwa unu n'aka ndi ala ọzọ, me ihe nile ekpere n'ikpe n'etiti unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Aga m esitekwa nʼetiti ya kpọpụta unu, were unu nyefee nʼaka ndị mba ọzọ, ma kpekwa unu ikpe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 11:9
22 Iomraidhean Croise  

ọzọ kwa, n'ihi ọbara nēmeghi ihe ọjọ nke ọ wusiri; o we mejue Jerusalem n'ọbara nēmeghi ihe ọjọ: Jehova ekweghi kwa ib͕aghara.


Site n'ubọchi nna-ayi-hà ayi onwe-ayi anọwo n'ikpe-ọmuma uku rue ta; ma n'ihi ajọ omume nile ayi ka enyere ayi onwe-ayi, na ndi-eze-ayi, na ndi-nchu-àjà-ayi, n'aka ndi-eze ala ọzọ, na mma-agha, na na ndọta-n'agha, na nime nluta-n'agha, na n'ihere iru, dika o si di ta.


Finehas wee guzo ọtọ, me ihe ekpere n'ikpe: Ewe b͕ochi ihe-otiti ahu.


O we nye ha n'aka mba di iche iche; Ndi nākpọ ha asì we nāchi ha.


N'ihi na emeghi ihe ekpere n'ikpe megide ọlu ọjọ ọsọsọ, n'ihi nka obi umu madu juru eju nime ha ime ihe ọjọ.


Ma unu onwe-unu, nurunu okwu Jehova, unu ndi nile emere ka unu je biri n'ala ọzọ, ndi M'zigara si na Jerusalem rue Babilon.


Eze Babilon we b͕ue umu-ndikom Zedekaia nime Ribla n'anya-ya: ọ bu kwa ndi nile nke Juda amara aha-ha ka eze Babilon b͕uru.


N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Ndi-unu eb͕uru eb͕u ndi unu tọb͕ọworo n'etiti ya, ha onwe-ha bu anu, obodo nka bu kwa ite: ma unu ka M'gēme ka unu si nime ya puta.


M'gēkpe kwa gi ikpe nile nke ndi bu nwunye nākwa iko, ndi nāwusi kwa ọbara; M'gēwere kwa gi nye ka i buru ọbara nke ọnuma na nke ekworo.


Ha gēsure kwa ulo-gi nile n'ọku, meso gi ihe nile ekpere n'ikpe n'anya ọtutu ndinyom; M'gēme kwa ka i kwusi ikwa iko; ọzọ, i gaghi-enye kwa onyinye ọzọ.


M'gāwukwasi gi ajọ iwem; ọku nke nrubiga-ókè nke iwem ka M'gēji fùkwasi gi: M'gēnye kwa gi n'aka ndikom bu nání anu-ọhia, ndi di ǹkà n'ibibi ebibi.


M'gēme kwa ihe nile ekpere n'ikpe n'Ijipt: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.


N'ihi nka ka ndi bu nna gēri umu-ha n'etiti gi, umu gēri kwa ndi bu nna-ha; M'gēme kwa ihe nile ekpere n'ikpe nime gi, M'gāb͕asa kwa ndi-gi nile fọduru nye ifufe nile.


Ọ gābu-kwa-ra mba nile nke di gi buruburu ihe-ita-uta, na ihe-nkwulu, na ihe-idọ-aka-na-nti, na ihe-iju-anya, mb͕e M'gēme ihe nile ekpere n'ikpe nime gi n'iwe, na n'ọnuma, na n'iba-nba nile nke ọnuma: Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo:


n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, Mu nēmegide gi, ọbuná Mu onwem; M'gēme kwa ihe nile nke ekpere n'ikpe n'etiti gi n'anya mba nile.


O nye-kwa-ra Ya ike ilu ọlu ikpé, n'ihi na Ọ bu Nwa nke madu.


n'ihi na ọ bu onye nējere Chineke ozi n'ebe i nọ iwetara gi ezi ihe. Ma ọ buru na i nēme ihe ọjọ, tua egwu; n'ihi na ọ bughi n'efu ka o nēbu mma-agha: n'ihi na ọ bu onye nējere Chineke ozi, onye-ọ́bọ̀ iwetara onye nēme ihe ọjọ iwe.


Jehova gēme ka gi na eze-gi, nke i gēguzo ka ọ buru eze-gi, jerue otù mba nke i nāmaghi, ma gi onwe-gi ma nna-gi-hà; i gēfè kwa chi di iche iche ọzọ n'ebe ahu, bú osisi na nkume.


ikpe madu nile ikpé, na itu ndi nile ndi nāsọpurughi Chineke ihe n'anya, bú ọlu nile nke asọpughi-Chineke ha nke ha luru n'asọpughi-Chineke, ha na okwu di ike nile nke ndi-nmehie ndi nāsọpurughi Chineke kwugidere Ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan