Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 11:24 - Bible Nso

24 Ma Mọ Chineke bulirim, me ka m'bata na Kaldea biakute ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, n'ọhuhu-ihe ahu nime Mọ Chineke. Ọhuhu-ihe ahu nke m'hururi we si n'ebe m'nọ rigo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Nʼime ọhụ, Mmụọ nke Chineke buliri m elu bubata m na Kaldịa, ebe ndị a dọkpụụrụ gaa mba ọzọ nọ. Otu a ka ọhụ m hụrụ si hapụ m.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 11:24
16 Iomraidhean Croise  

Ọ we rapu ikpayere ya uka, Chineke we si n'ebe Abraham nọ rigo.


Chineke we si n'ebe ọ nọ rigo n'ebe Ọ kpayere ya uka.


Ha we si ya, Biko, le, ọgu ndikom abua na iri, bú ndi-dìnkpà, nọ n'etiti ndi-orù-gi n'ebe a; biko, ka ha je, chọ onye-nwe-gi: eleghi anya Mọ nke Jehova eweliwo ya, tuda ya n'otù ugwu, ma-ọbu n'otù ndagwurugwu. Ọ si, Unu ezigala.


N'akuku osimiri nile nke Babilon, N'ebe ahu ka ayi nọduru ala, e, ayi kwara ákwá, Mb͕e ayi chetara Zaion.


Kaldea gāghọ kwa ihe-nkwata: afọ gēju ndi nile ndi nākwata ya; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


O rue, n'arọ nke-orú-na-iri, n'ọnwa nke-anọ, n'ubọchi nke-ise nke ọnwa ahu, mb͕e mu onwem nọ n'etiti ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ n'akuku osimiri Keba, na emeghere elu-igwe, m'we hu ọhù di iche iche nke Chineke.


okwu Jehova ruru Ezikiel nwa Buzi, bú onye-nchu-àjà, nti n'ezie n'ala ndi Kaldea, n'akuku osimiri Keba; aka Jehova we di ya n'aru n'ebe ahu.


Mọ Chineke we buliem, me ka m'biarue ọnu-uzọ-ama Iru-anyanwu nke ulo Jehova, nke nēche iru n'Iru-anyanwu: ma, le, n'oghere nke ọnu-uzọ-ama ahu ka orú ndikom na ise nọ; m'we hu n'etiti ha Jeazanaia nwa Azua, na Pelataia nwa Benaia, bú ndi-isi nke ndi Israel.


Mọ Chineke we buliem, m'we nu olu nke oké ùzù n'azum, si, Ihe agọziworo agọzi ka ebube Jehova bu site n'ọnọdu-Ya.


M'we biakute ndi ahu emere ka ha je biri n'ala ọzọ, na Tel-abib, bú ndi bi n'akuku osimiri Keba, m'we biarue ebe ha onwe-ha bi; m'we nọdu n'ebe ahu ubọchi asa n'anya o nējum n'etiti ha.


Aka Jehova we dikwasim, O we me ka m'pua apu nime Mọ nke Jehova, O we dọbam n'etiti ndagwurugwu ahu; ma ndagwurugwu ahu juputara n'ọkpukpu;


Mọ Chineke we buliem elu, me ka m'bata n'ogige di nime; ma le, ebube nke Jehova juputara n'ulo ahu.


O we setipu udi aka madu, jidem n'agiri-isi nke isim; Mọ Chineke we buliem elu n'etiti ala na elu-igwe, me ka m'bata Jerusalem n'ọhù nke Chineke, rue oghere nke ọnu-uzọ-ama nke ogige di nime nke nēche Ugwu iru; ebe ọnọdu ihe-oyiyi nke ekworo di, bú nke nākpasu ekworo.


Ewe me ihe a ub͕ò atọ: ngwa ngwa ewe nara ákwà ahu rigo n'elu-igwe.


Ma mb͕e ha siri na miri rigota, Mọ nke Onye-nwe-ayi wepuru Filip; onozi ahu ahughi kwa ya ọzọ, n'ihi na ọ nāga n'uzọ-ya nāṅuri ọṅu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan