Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 11:2 - Bible Nso

2 Ọ we sim, Nwa nke madu, ndia bu ndikom ahu ndi nēchè ajọ ihe, ndi nādu kwa ọdu ọjọ n'obodo a:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ndị a bụ ndị ikom na-agba izu ajọ ihe, na-enyekwa ndụmọdụ ọjọọ niile a na-enye nʼobodo a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 11:2
12 Iomraidhean Croise  

Esta we kwu kwa ọzọ n'iru eze, da n'ala n'iru ukwu-ya abua, kwa ákwá, riọ ya aririọ-amara, bú ka o me ka ihe ọjọ Heman, bú onye Egag, na èchìchè-ya nke o chère megide ndi-Ju gabiga.


Ajọ ihe ka ọ nēchè n'elu ihe-ndina-ya; Ọ nēguzo onwe-ya n'uzọ nke nādighi nma; Ọ dighi-aju ihe ọjọ.


Jehova, n'elu-igwe ka ebere-Gi di; Ikwesi-ntukwasi-obi-Gi nēru mbara-ígwé.


Ihe-ila-n'iyì di iche iche ka ire-gi nēchè; Dika aguba di nkọ, nālu ọlu aghughọ.


Ahuhu gādiri umu nēwezuga onwe-ha, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, ndi nēme ihe ezubeworo, ma o siteghi n'akam; ndi ji ihe-nkpuchi ekpuchi ihe, ma ọ bughi nke Mọm, ka ha we were nmehie tukwasi na nmehie:


Ọ dighi onye nākpọ madu eje ikpé n'ezi omume, ọ dighi kwa onye nēji ikwesi-ntukwasi-obi eje ikpé: ha nātukwasi obi n'ihe tọb͕ọrọ n'efu, ha nēkwu kwa okwu-ugha; ha nāturu ime ọnọdu ọjọ, mua ajọ ihe.


Ha we si, Bianu, ka ayi chè èchìchè megide Jeremaia; n'ihi na iwu agaghi-esi n'ebe onye-nchu-àjà nọ la n'iyì, ndum-ọdu agaghi-esi kwa n'ebe onye mara ihe nọ, okwu agaghi-esi kwa n'ebe onye-amuma nọ. Bianu, ka ayi were ire-ayi tib͕ue ya, ma ka ayi ghara iṅa nti n'okwu-ya nile.


ka M'jekuru ndi uku, gwa ha okwu; n'ihi na ndi ahu mara uzọ Jehova, na ikpé nke Chineke-ha. Ma ndi ahu ab͕ajiwo yoke n'otù, tijie ab͕u nile.


Nbibi gēsochi nbibi bia, akukọ gānọchi kwa akukọ; ha gāchọ kwa ọhù n'aka onye-amuma; ma iwu gālanari onye-nchu-àjà n'iyì, ndum-ọdu gālanari kwa ndi-okenye n'iyì.


Nime gi ka otù onye siri puta, nke nēchè ihe ọjọ megide Jehova, nādu kwa ọdu ihe jọb͕uru onwe-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan