Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 11:13 - Bible Nso

13 O rue, mb͕e M'buru amuma, na Pelataia nwa Benaia nwuru. M'we da kpue irum n'ala, tie nkpu n'oké olu, si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! ọ̀ bu ka ndi Israel fọduru gwusia ka Gi onwe-gi nēme?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Mgbe m ka nọ na-ebu amụma, Pelataya nwa Benaya nwụrụ. Mụ onwe m kpuo ihu m nʼala kwaa akwa sị, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ị ga-ebibi ndị niile fọdụrụ nʼala Izrel?”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 11:13
22 Iomraidhean Croise  

O rue, mb͕e eze nuru okwu onye nke Chineke ahu, nke ọ kpọrọ megide ebe-ichu-àjà nime Bet-el, na Jeroboam siri n'ebe-ichu-àjà setipu aka-ya, si, Jidenu ya. Aka-ya, nke o setiri imegide ya, we kpọnwua, ọ pughi kwa iseghachi ya n'aru ya.


O we si na O gēkpochapu ha, Ma ọ buru na Moses, bú onye Ọ rọputaworo, eguzoghi na ntiwa ahu n'iru Ya, Ime ka ọnuma-Ya si n'ibibi ha laghachi.


Aji anu-arum guzoro ọtọ site n'oké egwu-Gi; Ọ bu kwa ikpé-Gi nile ka m'nātu egwu ha.


N'ihi nka nhuju-anya-ya gābia na mberede; N'otù ntabi-anya ka agētipia ya, ọ dighi kwa ngwọta di.


Mọ Chineke we buliem, me ka m'biarue ọnu-uzọ-ama Iru-anyanwu nke ulo Jehova, nke nēche iru n'Iru-anyanwu: ma, le, n'oghere nke ọnu-uzọ-ama ahu ka orú ndikom na ise nọ; m'we hu n'etiti ha Jeazanaia nwa Azua, na Pelataia nwa Benaia, bú ndi-isi nke ndi Israel.


Okwu Jehova we ruem nti, si,


Anyam we mere ha ebere ka M'ghara ibibi ha, emeghkwam ka ha gwusia n'ọzara.


M'we bue amuma dika esiri nyem iwu: otù olu we da mb͕e m'nēbu amuma, ma, le, ime-nkpatu di, ọkpukpu we biarute onwe-ha nso, ọkpukpu n'ọkpukpu nke ya.


Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri ala Israel, Ọgwugwu: ọgwugwu abiakwasiwo nkuku anọ nke ala-unu.


O rue, mb͕e ha nētib͕u, ma nání mu onwem fọduru, na adaram kpue irum n'ala, tie nkpu, si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! Ọ̀ bu onye-nbibi nke Israel nile ndi fọduru ka I gābu mb͕e I nāwukwasi Jerusalem ọnuma-Gi?


N'ihi nka ka M'jiworo ndi-amuma b͕utue ha; ejiwom okwu nile nke ọnum b͕ue ha: ikpé-gi nile di kwa ka ìhè nke nāputa aputa.


O rue, mb͕e ha ripiasiri ihe-ọkukú nile nke ala, na m'siri, Onye-nwe-ayi Jehova, biko, b͕aghara: Jekob, ò gēsi aṅa guzosie ike? n'ihi na onye ntà ka ọ bu.


M'we si, Onye-nwe-ayi Jehova, biko, rapu: Jekob, ò gēsi aṅa guzosie ike? n'ihi na onye ntà ka ọ bu.


Ub͕u a, le, aka Onye-nwe-ayi di kwa n'aru gi, i gēkpu kwa ìsì, nāhughi anyanwu nwa oge. Ngwa ngwa alulu na ọchichiri dakwasiri ya; o we nējeghari nāchọ ndi gējide ya n'aka idu ya.


O we da n'ala ngwa ngwa n'ukwu-ya, kubìe ume: umu-okorọbia ahu we bata, hu ya ka ọ nwuru, ha we bupu ya, lìe ya n'akuku di-ya.


Ma mb͕e Ananaias nuru okwu ndia ọ da n'ala, kubìe ume: ndi nile nke nuru ya we tua oké egwu.


N'ihi na ọ gēwezuga nwa-gi nwoke n'isom n'azu, ka ha we fè chi ọzọ: iwe Jehova gādi kwa ọku megide unu, Ọ gēkpochapu kwa gi ngwa ngwa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan