Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 10:4 - Bible Nso

4 Ebube Jehova we si n'elu cherub rigo, guzo n'elu nbata-uzọ nke ulo ahu; ulo ahu we juputa n'igwe-oji ahu; ogige-ya juputa-kwa-ra n'onwunwu-ìhè nke ebube Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Mgbe ahụ, ebube Onyenwe anyị sitere nʼelu cherubim bilie, bịa guzo nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ. Ụlọnsọ ahụ jupụtakwara nʼigwe ojii, ihe nke ebube Onyenwe anyị jupụtakwara nʼogige ụlọnsọ ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 10:4
15 Iomraidhean Croise  

Igwe-oji ahu we kpuchie ulo-ikwū nzute, ebube Jehova we juputa ebe-obibi ahu.


Moses apughi kwa ibà n'ulo-ikwū nzute, n'ihi na igwe-oji ahu biri n'elu ya, ebube Jehova juputa-kwa-ra ebe-obibi ahu.


N'arọ nke ọnwu eze, bú Uzaia, m'we hu Onye-nwe-ayi ka Ọ nānọkwasi n'oche-eze di elu nke ebuliwo-kwa-ra elu, ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-Ya juputa-kwa-ra ulo uku Chineke.


Dika eke-na-ogwurugwu si di n'ile ya anya, bú nke di n'igwe-oji n'ubọchi nke miri-ozuzo, otú a ka onwunwu-ọku ahu si di n'ile ya anya, bú nke di ya buruburu. Nka bu ka oyiyi nke ebube Jehova si di n'ile ya anya. M'we hu ya, da kpue irum n'ala, m'we nu olu nke otù Onye nēkwu okwu.


Ebube Jehova we si n'elu nbata-uzọ nke ulo ahu pua, guzo n'elu cherubim.


ma le, ebube nke Chineke nke Israel si n'uzọ Iru-anyanwu bia: olu-Ya di kwa ka olu ọtutu miri: uwa nwu-kwa-ra enwu site n'ebube-Ya.


Mọ Chineke we buliem elu, me ka m'bata n'ogige di nime; ma le, ebube nke Jehova juputara n'ulo ahu.


O we me ka m'bia n'uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke Ugwu n'iru ulo ahu; m'we hu, ma le, ebube Jehova juputara ulo Jehova: m'we da kpuchie irum n'ala.


Ma ebube nke Chineke nke Israel siri n'elu cherub ahu nke ọ di n'elu ya rigorue nbata-uzọ nke ulo ahu: O we kpọ nwoke ahu nke yiri uwe ọcha, nke nwere mpi ink nke ode-akwukwọ n'úkwù-ya, òkù.


Ebube ikpe-azu nke ulo a gādi uku kari ebube mbu, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: ọ bu kwa n'ebe a ka M'gēnye udo; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta.


Kora we kpọkọta nzukọ Israel nile megide ha rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute: ewe me ka nzukọ ahu nile hu ebube Jehova anya.


Ulo nsọ ahu we juputa n'anwuru-ọku nke si n'ebube Chineke puta, si kwa n'ike-Ya puta; ọ dighi kwa onye ọ bula puru ibà nime ulo nsọ ahu, rue mb͕e ihe-otiti asa ahu nke ndi-mọ-ozi asa ahu gāgwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan