Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 10:20 - Bible Nso

20 Nka bu ihe ahu di ndu nke m'huru n'okpuru Chineke nke Israel n'akuku osimiri Keba; m'we mara na cherubim ka ha bu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Ndị a bụ ihe ndị ahụ dị ndụ, nke m hụrụ nʼokpuru Chineke Izrel nʼakụkụ osimiri Keba, amatara m na ha bụ cherubim.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 10:20
8 Iomraidhean Croise  

O b͕ue eb͕ub͕u cherubim na ọdum na nkwu n'elu mbadamba aka-ya nile, na n'elu ihe-njikọ-ya nile, dika ọnọdu di efu nke ebe ọ bula si di, ha na ihe aturu atu buruburu.


O rue, n'arọ nke-orú-na-iri, n'ọnwa nke-anọ, n'ubọchi nke-ise nke ọnwa ahu, mb͕e mu onwem nọ n'etiti ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ n'akuku osimiri Keba, na emeghere elu-igwe, m'we hu ọhù di iche iche nke Chineke.


Ọzọ, n'etiti ya ka oyiyi nke ihe anọ di ndu si puta. Ma nka bu ka ha si di n'ile ha anya; oyiyi madu ka ha nwere.


Cherubim we bulie onwe-ha elu: nka bu ihe ahu nke di ndu nke m'huru n'akuku osimiri Keba.


M'we bilie, pua, jerue ndagwurugwu ahu: ma, le, n'ebe ahu ka ebube Jehova nēguzo, dika ebube nke m'huru n'akuku osimiri Keba: m'we da kpue irum n'ala.


Ọ di kwa ka ọhù nke m'huru si di n'ile ya anya, dika ọhù m'huru mb͕e m'biara ibibi obodo ahu; ọhù nile di kwa ka ọhù ahu nke m'huru n'akuku osimiri Keba: m'we da kpuchie irum n'ala.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan