Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 10:1 - Bible Nso

1 M'we hu, ma, le, nime mbara-ígwé ahu nke di n'elu isi cherubim, ihe dika nkume sapphire, dika oyiyi oche-eze si di n'ile ya anya, ka ahuru n'elu ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Mgbe ahụ, elere m anya hụ ocheeze ọma e ji nkume safaia wuo ka ọ pụtara ihe na mbara eluigwe, nʼelu ebe ahụ isi cherubim ndị ahụ dị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 10:1
27 Iomraidhean Croise  

Jehova we si, Mu onwem, M'nēzonari Abraham ihe Mu onwem nēme;


o welie anya-ya abua elu, hu, ma, le, ndikom atọ nēguzo onwe-ha na ncherita-iru ya: mb͕e ọ huru ha, o si n'ọnu-uzọ ulo-ikwū ahu b͕a ọsọ izute ha, ọ kpọ isi ala,


Ndikom ahu we si n'ebe ahu che iru je n'uzọ Sọdọm: ma Abraham nēguzogide n'iru Jehova.


Ọ si, Biko, le, ejisiwom ike igwa Onye-nwe-ayi okwu: eleghi anya agāchọta n'ebe ahu orú. Ọ si, M'gaghi-ebibi ya n'ihi orú ahu.


O we chupu madu ahu, me ka Cherubim nọdu n'akuku Iru-anyanwu nke ubi Iden ab͕ara ogige, ha na ire-ọku nke mma-agha nke nēchighari onwe-ya, ichebe uzọ osisi ahu nke ndu.


O we fọdu Jekob nání ya; otú nwoke we so ya nāb͕a nb͕a rue chi-ọbubọ.


Jekob we kpọ aha ebe ahu Peniel: n'ihi na ahuwom Chineke iru na iru, ka o kwuru, ewe naputa ndum.


O we nọkwasi n'elu cherub dika inyinya, we felie: O we fesie ike n'elu nkù ìfùfè.


ha we hu Chineke nke Israel; ma n'okpuru ukwu-Ya abua ọ di ka pavement eji nkume sapphire me, ọ di kwa ka elu-igwe onwe-ya n'idi-ọcha.


O rue, mb͕e ọtutu ubọchi gasiri, na Jehova sirim, Bilie, je Yufretis, weputa ihe-ọkiké ahu n'ebe ahu, bú nke M'nyere gi iwu izobe n'ebe ahu.


Okwu Jehova we ruem nti, si,


O rue, n'arọ nke-orú-na-iri, n'ọnwa nke-anọ, n'ubọchi nke-ise nke ọnwa ahu, mb͕e mu onwem nọ n'etiti ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ n'akuku osimiri Keba, na emeghere elu-igwe, m'we hu ọhù di iche iche nke Chineke.


Nka bu ihe ahu di ndu nke m'huru n'okpuru Chineke nke Israel n'akuku osimiri Keba; m'we mara na cherubim ka ha bu.


Cherubim ahu we chilie nkù-ha, wheel nile ha di kwa n'akuku ha; ebube nke Chineke nke Israel di kwa n'elu ha n'elu.


Ma, le, nwoke ahu nke yiri uwe ọcha, nke nwere mpi ink n'úkwù-ya, nēweghachi okwu, si, Emewom dika I nyerem iwu.


N'elu ebe m'nēche ka m'gēguzo, guzo kwa onwem n'elu ebe ewusiri ike, m'gēche kwa ihu ihe Ọ gēkwu megidem, na ihe m'gāzaghachi bayere iba-nbam.


Ọ dighi onye ọ bula huworo Chineke mb͕e ọ bula; Chineke, bú Ọkpara amuru nání Ya, Onye nādabere n'obì Nna-Ya, Onye ahu kọrọ Ya nye madu.


nke Ọ lusiri ike nime Kraist, mb͕e O mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, me kwa ka Ọ nọdu n'aka-nri-Ya n'ebe di n'elu-igwe,


Jehova we si Joshua, Le, enyewom Jeriko, na eze-ya, na ndi-dike nile, bú dinkpà, n'aka-gi.


Onye nọ n'aka-nri nke Chineke, ebe Ọ gara ba n'elu-igwe; edowo kwa ndi-mọ-ozi na ndi nāchi isi na ndi di ike n'okpuru Ya.


n'etiti ihe-idọba-oriọna asa ahu ahu-kwa-ram otù Onye yiri nwa nke madu, Onye nēyi uwe nke ruru n'ukwu ala, ewerewo kwa ihe-ọkiké nke ọla-edo ke n'obi-Ya gburugburu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan