Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 1:27 - Bible Nso

27 M'we hu ihe di ka ib͕u-maramara amber, ihe di ka ọku si di n'ile ya anya nke di nime ya buruburu, site n'ihe bu úkwù-ya n'ile ya anya we rigo elu; ọzọ, site n'ihe bu úkwù-ya n'ile ya anya we ridata ahurum ihe nke di ka ọku si di n'ile ya anya, onwunwu-ọku di-kwa-ra ya buruburu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

27 Site nʼụkwụ ya ruo nʼisi ya, ahụ onye ahụ na-egbu maramara dịka ọkụ. Site nʼụkwụ ya ruo nʼukwu ya, ọ dị ka ọkụ na-enwu enwu, ìhè nke na-enwukwa ka ọkụ gbara ya gburugburu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 1:27
11 Iomraidhean Croise  

Ebube na ima-nma di n'iru Ya: Ike na ọṅù di n'ebe-Ya.


Ka Chineke-ayi bia, Ya ab͕a-kwa-la nkiti: Ọku nēripia n'iru Ya, Buruburu Ya ka ifufe nēfesi kwa ike nke-uku.


Igwe-oji na oké ọchichiri di Ya buruburu: Ezi omume na ikpé ziri ezi bu ọnọdu guzosiri ike nke oche-eze-Ya.


Ma nile ebube Jehova anya, ọ di ka ọku nērichapu n'elu ugwu ahu n'anya umu Israel.


M'we hu, ma, le, oké ifufe nēsi n'Ugwu bia, oké igwe-oji, na ọku nke nānwude onwe-ya mb͕e nile, onwunwu di-kwa-ra ya buruburu, ọ bu kwa n'etiti ya, bú n'etiti ọku ahu, ka ihe dika amber n'ile ya anya nēb͕upu.


M'we hu, ma, le, oyiyi dika ọku si di n'ile ya anya; site n'ihe bu úkwù-Ya n'ile ya anya we ridata, ọ bu ọku: ọzọ, site n'úkwù-Ya we rigo elu, ọ di ka onwunwu-ìhè si di n'ile ya anya, dika ib͕u-maramara amber.


Onwunwu-Ya di ka ìhè; Ìhè nēnwuputa n'aka-Ya: Ọ bu kwa n'ebe ahu ka ebe-nzuzo nke ike-Ya di.


N'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, ọku nēripia eripia ka ọ bu, Chineke ekworo.


nime ọku nēre ere, nābọ̀ ọ́bọ̀ n'aru ndi nāmataghi Chineke, ha na ndi nāṅaghi nti ozi ọma nke Onye-nwe-ayi Jisus:


n'ihi na Chineke-ayi bu ọku nērechapu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan