Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 1:24 - Bible Nso

24 Mb͕e ha nāga m'we nu olu nkù nile ha, dika olu ọtutu miri, dika olu nke Onye puru ime ihe nile, olu nkpọtu dika olu ọmuma-ulo-ikwū: mb͕e ha guzoro, ha wuda nkù-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Mgbe ha na-aga, nku ha na-eme mkpọtụ dị ka mkpọtụ ebili mmiri na-amagharị amagharị. Mkpọtụ ahụ dịkwa ka ịda ụda nke olu Onye pụrụ ime ihe niile, ka olu iti mkpu nke usuu ndị agha. Mgbe ọbụla ha guzoro, ha na-achịtu nku ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 1:24
12 Iomraidhean Croise  

N'ihi na Onwe-nwe-ayi mere ọmuma-ulo-ikwū Siria ka ha nu olu ub͕ọ-ala, na olu inyinya, bú olu oké usu-ndi-agha: ha we sirita onwe-ha, Le, eze Israel egowo ndi-eze ndi Het, na ndi-eze Ijipt, imegide ayi, ibiakwasi ayi.


Genu nti nke-ọma n'ime-nkpatu nke olu-Ya, Na ntamu nke nēsi n'ọnu-Ya puta.


Jehova we ma éb͕è-elu-igwe n'elu-igwe, Onye kachasi ihe nile elu nēme kwa ka olu-Ya da; Ákú-miri-ígwé na icheku ọku.


Bùkuenu Onye ahu Nke elu-igwe kachasi elu-igwe nile, nke di mb͕e ochie, nēbu dika inyinya; Le, Ọ nēme ka olu-Ya da udà, ọ bu olu ike.


Anu-kwa-ra olu nkù nile nke cherubim rue ogige di n'èzí, dika olu nke Chineke Nke puru ime ihe nile mb͕e Ọ nēkwu okwu.


M'we nu olu nke nkù nile nke ihe anọ ahu di ndu ka ha nēmeturita ibe-ha, na olu wheel nile nke di n'akuku ha, ọbuná olu nke oké ùzù.


ma le, ebube nke Chineke nke Israel si n'uzọ Iru-anyanwu bia: olu-Ya di kwa ka olu ọtutu miri: uwa nwu-kwa-ra enwu site n'ebube-Ya.


aru-ya di kwa ka beryl, iru-ya di kwa ka àmùmà si di n'ile ya anya, anya-ya abua di kwa ka ọwa nēnwu ọku, ogwe-aka-ya abua na ukwu-ya abua di kwa ka ib͕u-maramara nke ọla akwọchara akwọcha, olu okwu-ya nile di kwa ka olu ìgwè madu.


ukwu-Ya abua di kwa ka ọla akwọchapuru ka o b͕upu, dika agāsi na erere ya-ri n'oké ọku; olu-Ya di kwa ka olu ọtutu miri.


M'we nu ihe dika olu nke oké ìgwè ndi, di kwa ka olu ọtutu miri, di kwa ka olu éb͕è-elu-igwe di ike, nāsi, Haleluya: n'ihi na Onye-nwe-ayi Chineke-ayi, Onye puru ime ihe nile, nābu eze.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan