Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 9:8 - Bible Nso

8 Abarala onye nākwa emò nba, ka o we ghara ikpọ gi asì: Bara onye mara ihe nba, ọ gāhu kwa gi n'anya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Abarala ndị na-akwa emo mba, ma ọ bụghị ya, ha ga-akpọ gị asị; baara ndị maara ihe mba, ha ga-ahụ gị nʼanya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 9:8
23 Iomraidhean Croise  

Ha we gosi eze, si, Le, Netan, bú onye-amuma. O we bata n'iru eze, kpọ isi ala nye eze, kpuchie iru-ya n'ala.


Eze, bú Devid, we si, Kpọrọnum Zedok, bú onye-nchu-àjà, kpọ kwa Netan, bú onye-amuma, kpọ kwa Benaia nwa Jehoiada. Ha we bia n'iru eze.


Eze Israel we si Jehoshafat, Otù nwoke ọzọ di kwa iju Jehova ase n'aka-ya, bú Maikaia nwa Imla: ma mu onwem kpọrọ ya asì; n'ihi na ọ dighi-ebu amuma ezi ihe bayerem, kama ihe ọjọ. Jehoshafat we si, Ka eze ghara ikwu otú a.


Ka onye ezi omume tib͕uem, ọ gābu ebere; Ya ba-kwa-ram nba, ọ gābu manu isi; Ekwela ka isim si, É-è: N'ihi na m'nọ nēkpe ekperem imegide ihe ọjọ ha nile.


Ka onye mara ihe we nu, we tukwasi ihe-nmuta n'amam-ihe-ya; Ka onye-nghọta we nweta kwa ezi ndum-ọdu:


Ndi obi-ha mara ihe gānata ihe enyere n'iwu: Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka agākwatu.


Nwa nke mara ihe nānu idọ-aka-na-nti nna-ya: Ma onye nākwa emò anughi ibasi-nba-ike.


Inọ-n'ob͕eye na nlelì gādiri onye nēzere idọ-aka-na-nti: Ma onye nāriba iba-nba ama ka agāsọpuru.


Ọ dighi-atọ onye nākwa emò utọ ka abara ya nba: Ọ bughi onye mara ihe ka ọ gējekuru.


Tie onye nākwa emò ihe, onye nēnweghi uche gāghọ onye nwere ezi uche: Ọzọ, bara onye-nghọta nba, ọ gāghọta ihe-ọmuma.


Zuta ezi-okwu, ere-kwa-la ya; E, amam-ihe, na idọ-aka-na-nti, na nghọta.


Ekwula okwu na nti onye-nzuzu; N'ihi na ọ gēleda ezi uche nke okwu-gi nile anya.


Onye nābara madu nba gēmesia huta amara Kari onye nēkwu ire-utọ.


Onye anābara nba ọtutu mb͕e ma ọ nēkwesi olu-ya ike, N'otù ntabi-anya ka agētipia ya, ọ dighi kwa ngwọta di.


Ma ha b͕ara nkiti, ha azaghi kwa ya okwu: n'ihi na ihe eze nyere n'iwu bu nka, si, Unu azala ya.


Akpọla nwa-nne-gi asi n'obi-gi: i ghaghi ibara madu-ibe-gi nba, ghara ibu nmehie bayere ya.


Rapunu ha: ha bu ndi-ndú kpuru ìsì. Ma ọ buru na onye-ìsì edu onye-ìsì, ha abua gādabà n'olùlù.


Unu enyela nkita ihe di nsọ, unu atuda-kwa-la pearl-unu n'iru ezì, ka ha ghara izọkwasi ha n'ukwu-ha ma eleghi anya, we chigharia, dọka unu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan