Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 8:9 - Bible Nso

9 Ha nile putara ìhè n'ebe onye-nghọta nọ, Ha zi-kwa-ra ezi n'ebe ndi nāchọta ihe-ọmuma nọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Nʼebe onye nwetara nghọta nọ, okwu m doro anya; nʼebe ndị chọtara ihe ọmụma nọ, okwu m ziri ezi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 8:9
17 Iomraidhean Croise  

Onye nākwa emò achọwo amam-ihe, ma ọ hughi ya: Ma ihe-ọmuma diri onye-nghọta nfe.


Obi onye-nghọta nāchọ ihe-ọmuma: Ma ọnu ndi-nzuzu nāzù onwe-ya n'uche b͕agọrọ ab͕agọ dika anu-ulo.


Uzọ ndu nārigo elu n'ebe onye nwere uche nọ, Ka o we si n'ala-mọ di n'okpuru wezuga onwe-ya.


N'iru onye-nghọta ka amam-ihe di: Ma anya abua nke onye-nzuzu di na nsọtu uwa.


Obi onye-nghọta nēnweta ihe-ọmuma; Ọzọ, nti ndi mara ihe nāchọ ihe-ọmuma.


Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu nke chọtaworo amam-ihe bu, Ya na madu nke nēnweputa nghọta.


Uzọ atuliri atuli, ọbuná uzọ, gādi kwa n'ebe ahu, Uzọ nke idi-nsọ ka agākpọ kwa ya; onye ruru árú agaghi-agabiga na ya; ma uzọ ahu gādiri ndi ahu: onye ọ bula nke nāga n'uzọ, ọbuná ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha, ha agaghi-akpafu akpafu.


Gi ulo Jekob, àgāsi, Mọ nke Jehova, Ọ̀ rapuru ibu onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ? ihe ndia, hà bu omume-Ya? okwum nile, hà adighi-eme onye nējeghari n'ezi nma?


Edewo ya n'akwukwọ ndi-amuma, si, Ha nile gābu kwa ndi Chineke zíworo ihe. Onye ọ bula nke nuworo site n'ọnu Nnam, nke mutawo-kwa-ra ihe, ọ nābiakutem.


Ọ buru na onye ọ bula achọ ime ihe Ọ nāchọ, ọ gāmara ihe ozizí a bu, ma o sitere n'aka Chineke, ma-ọbu na Mu onwem nēkwu site n'Onwem.


Ma ọ buru na amam-ihe fọduru onye ọ bula nime unu inwe, ya riọ n'aka Chineke, Onye nēnye madu nile n'afọ-ofufọ, nātaghi kwa uta; agēwere kwa ya nye ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan