33 Nurunu idọ-aka-na-nti, we mara ihe, Unu eze-kwa-la ya ndu.
33 Gee ntị na ndụmọdụ m ka ị bụrụ onye maara ihe, agbakụtakwala ndụmọdụ m azụ.
N'isi ebe nile anātu ùzù ka ọ nākpọ òkù; N'oghere ọnu-uzọ-ama nile, N'obodo, ka o nēkwu okwu-ọnu-ya nile:
Ka onye mara ihe we nu, we tukwasi ihe-nmuta n'amam-ihe-ya; Ka onye-nghọta we nweta kwa ezi ndum-ọdu:
Nwam, nuru idọ-aka-na-nti nke nna-gi, Arapu-kwa-la iwu nne-gi:
Onye nēzere idọ-aka-na-nti nāju nkpuru-obi nke aka ya: Ma onye nānu iba-nba nēnweta obi amam-ihe.
Nuru ndum-ọdu, nara kwa idọ-aka-na-nti, Ka i we mara ihe n'ikpe-azu-gi.
Umum, nurunu idọ-aka-na-ntí nke nna, Tọ-kwa-nu nti n'ala ima nghọta:
Nwam, ṅa nti n'amam-ihem; Tọ nti-gi n'ala nye nghọtam:
Lezienu anya ka unu ghara iju Onye ahu nēkwu okwu. N'ihi na asi na ndi ahu ab͕anarighi Ya, mb͕e ha juru Onye ahu Nke nādu ha ọdú n'elu uwa, ayi onwe-ayi agaghi-ab͕anari Ya kari nke-uku, bú ndi nāb͕akuta Onye ahu azu Nke nādu ọdú site n'elu-igwe: