Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 8:18 - Bible Nso

18 Àkù na nsọpuru di n'akam; E, àkù nke nādigide na ezi omume.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Ana m ekenye ụba na nsọpụrụ, na ikpe ziri ezi na ezi omume.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 8:18
21 Iomraidhean Croise  

Ihe di iche iche di oké ọnu-ahia na àkù di n'ulo-ya: Ezi omume-ya nēguzo kwa rue mb͕e ebighi-ebi.


Ezi omume-Gi di ka ugwu Chineke; Ikpé-Gi nile bu ob͕u-miri riri nne: Ọ bu madu na anumanu ka I nāzọputa, Jehova.


Àkù adighi-aba urù n'ubọchi nke nrubiga-ókè nke iwe: Ma ezi omume nānaputa n'ọnwu.


Site kwa n'ihe-ọmuma ka ime-ulo-ya nile nējuputa N'àkù nile di oké ọnu-ahia di kwa utọ.


Ubọchi ndu di ogologo di n'aka-nri-ya; N'aka-ekpe-ya ka àkù na nsọpuru di.


Ma burunu uzọ chọ ala-eze-Ya, na ezi omume-Ya; agātukwasi-kwa-ra unu ihe ndia nile.


ma otu ihe bu ihe di nkpà: n'ihi na Meri rọputara ezi òkè ahu, nke anāgaghi-anapu ya.


Renu ihe unu nwere, were ha lua ọlu ebere; merenu onwe-unu àkpà-ego nke nādighi-aka nká, àkù nādighi-agwu agwu n'elu-igwe, ebe onye-ori nādighi-abia nso, ebe nla nādighi-emebi kwa ihe.


dika ndi ihe nēwuta, ma ayi nāṅuri ọṅu mb͕e nile; dika ndi-ob͕eye, ma ayi nēme ka ọtutu madu buru ọgaranya; dika ndi nēnweghi ihe, ma ayi nēnwezu ihe nile.


Ọ bu mu onwem, bú onye di ntà kari onye dikarisiri ntà n'etiti ndi nsọ nile, ka enyere amara nka, izisara ndi mba ọzọ ozi ọma nke àkù nke Kraist nke anēnweghi ike ituputa ya;


Ma Chinekem gēnyezu unu ihe nile ọ bula nākpa unu dika àkù-Ya n'ebube si di, nime Kraist Jisus.


Nurunu, umu-nnam ndi m'huru n'anya; Chìneke arọputaghi ndi bu ob͕eye n'ihe nke uwa ka ha buru ndi-ọgaranya n'okwukwe, buru kwa ndi-nketa nke ala-eze ahu nke O kwere nkwa inye ndi huru Ya n'anya?


aduam gi ọdú ka i zuru n'akam ọla-edo nke erechaworo n'ọku, ka i we ghọ ọgaranya; ka i zuru kwa uwe ọcha, ka i we bokwasi onwe-gi, ka ewe ghara ime ka ihere nke ib͕a-ọtọ-gi puta ìhè; ka i zuru kwa ọgwu-anya ite n'anya-gi, ka i we nāhu uzọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan