O rue, mb͕e ubọchi ọ nọduru n'ebe ahu di anya, na Abimelek, bú eze ndi Filistia, leputara anya na window, hu, ma le, Aisak na Rebeka, bú nwunye-ya, nēgwu egwú.
O rue, mb͕e ib͕e Jehova batara n'obodo Devid, na Maikal nwa-nwayi Sọl lepuru anya na window, hu eze, bú Devid, ka ọ nāwuli, nēte kwa egwú, n'iru Jehova; o we leda ya anya n'obi-ya.
Onye ihe-ya nātọm utọ yiri mb͕ada ma-ọbu nwa-ele: Le kwa, ọ nēguzo n'azu mb͕idi-ayi, Ọ nēsi na window nile lebata anya, Anya-ya nēsi n'oghere-inara-ifufe nwubata.
Na window-ya ka ọ lepuru anya, tie nkpu, Bú nne Sisera, site n'oghere inara ifufe, Gini mere ub͕o-ala-ya nānọ ọdù ibia? Gini mere wheel nke ub͕ọ-ala-ya nile ji la azu?