19 N'ihi na dim anọghi n'ulo, O jewo ije di anya:
19 Nʼihi na di m anọghị nʼụlọ o jeela njem dị anya.
Bia, ka afọ jubiga ayi ókè n'ikwa-iko rue ututu; Ka ayi me ka obi tọ ayi utọ n'ihu-n'anya nile.
Ọ werewo akpa ego n'aka-ya; N'ubọchi ọnwa-ndọzu ka ọ gālata.
Le nwanyi nākwa iko! mb͕e ọ nọ n'okpuru di-ya ọ nēwere ndi nābughi di-ya!
Ma mb͕e ha natara ya, ha tamube megide nna-nwe-ulo ahu,
Ma unu mara nka, na ọ buru na nna-nwe-ulo matarari oge nche onye-ori gābia, ọ ganēche nche, ọ gaghi-ekwe kwa ka egwupú ulo-ya.
Ma ọ buru na orù ọjọ ahu gāsi n'obi-ya, Onye-nwem nānọ ọdù di anya;
Ma unu mara nka, na ọ buru na nna-nwe-ulo matarari oge hour onye-ori gābia, ọ ganēche nche, ọ gaghi-arapu kwa ulo-ya ka egwupú ya.