Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 7:13 - Bible Nso

13 Nwanyi ahu we jide ya aka, sutu kwa ya ọnu, Were iru ihere nādighi si ya:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 O weere aka ya abụọ jikụọ nwokorobịa ahụ nʼolu, sutu ya ọnụ, were ihu nke ihere na-adịghị, sị:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 7:13
14 Iomraidhean Croise  

Nwayi ahu we jide ya n'uwe-ya, si, Ka mu na gi dina; o we rapu uwe-ya n'aka-ya, b͕alaga, pua n'èzí.


O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na nwunye nke onye-nwe-ya weliri anya-ya abua lekwasi Josef, si, Ka mu na gi dina.


N'ihi na, le, ha echewo nkpuru-obim anwu; Ndi di ike nēzukọ imegidem: Ọ bughi n'ihi njehiem, ọ bughi kwa n'ihi nmehiem, Jehova.


Onye nēmebi iwu emewo ka iru-ya sie ike: Ma onye ziri ezi, onye ahu nēdozi uzọ-ya nile.


Ikpọ ndi nāgabiga n'uzọ òkù, Bú ndi nāgazi agazi n'okporo-uzọ-ha,


Ma Onye-nwe-ayi Jehova nēyerem aka; n'ihi nka etiyeghm n'ọnọdu-ihere: n'ihi nka ka m'cheworo irum dika ọmú, ama-kwa-ram na ihere agaghi-emem.


Ndinyom nile nke nākwa iko ka ha nēnye onyinye: ma gi onwe-gi enyewo ndikom nile nāhu gi n'anya onyinye-gi nile, i we go ha ngo, ka ha si n'ebe nile di buruburu biakute gi n'ihi ikwa-iko-gi nile.


Umu-ha bu kwa ndi nēnweghi ihere n'iru, ndi obi-ha di ike; Mu onwem nēziga gi jekuru ha: i gāsi kwa ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova, siri.


Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, atula egwu ha, atu-kwa-la egwu okwu nile ha, asi na ogwu na uke di n'ebe i nọ, asi kwa na ọ bu n'etiti akpi ka i bi: atula egwu okwu nile ha, atu-kwa-la ujọ iru-ha, n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu.


Israel we biri na Shitim, ndi Israel we malite isoro umu-ndinyom Moab nākwa iko:


Le, ndia buru umu Israel, n'okwu-ọnu Belam, ihe nēweta nmekpu megide Jehova n'okwu Peoa, ihe-otiti ahu we di n'etiti nzukọ Jehova.


Ma enwerem nka imegide gi, na i kwere nwanyi ahu, bú Jezebel, onye nākpọ onwe-ya onye-amuma-nwanyi; o nēzí kwa ndi-orùm ihe, nēduhie kwa ha, ka ha kwa iko, ri kwa ihe achuru n'àjà nye arusi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan