6 Jekuru ndanda, onye-ume-ngwu; Le uzọ-ya nile, we mara ihe:
6 Gaa mụta ihe site nʼaka ndanda, gị onye umengwụ. Mụta ihe site nʼụzọ ya niile.
N'ihi na ọ bu n'efu ka anāb͕asa ub͕u, N'anya nnunu ọ bula:
Dika manya b͕ara uka si adi n'ebe ezé di, na dika anwuru-ọku si adi n'ebe anya di, Otú a ka onye-ume-ngwu nādi n'ebe ndi nēzì ya ozi nọ.
Ob͕eye ka onye ji ọbu-aka ume-ngwu alu ọlu gābu: Ma aka ndi di nkọ nēme ọgaranya.
Ọ nāchọsi ike, ma ọ dighi ihe o nwere, bú nkpuru-obi onye-ume-ngwu: Ma nkpuru-obi nke ndi di nkọ, agēme ya ka ọ ma abuba.
Uzọ onye-ume-ngwu di ka ogige ogwu: Ma okporo-uzo ndi ziri ezi bu uzọ atuliri atuli.
Ọzọ, onye di ume-ngwu n'ije-ozi-ya, Onye ahu bu nwa-nne nke onye-nwe nbibi.
Ume-ngwu nēme ka oké ura dakwasi madu; Ọ bu kwa nkpuru-obi nke di ume-ngwu ka agu nāgu.
Onye-ume-ngwu esumiwo aka-ya n'ọkwa, Ọ gaghi-eweghachi ya ọbuná n'ọnu-ya.
N'ihi na ọ bu mb͕e oyi nātu, onye-ume-ngwu agaghi-alu ọlu ubi; Ọ gāriọ aririọ na mb͕e owuwe-ihe-ubi, ọ dighi kwa ihe ọ gēnwe.
Ọchichọ siri ike nke onye-ume-ngwu nēme ka ọ nwua; N'ihi na aka-ya abua juru ilu ọlu.
Onye-ume-ngwu asiwo, Ọdum di n'èzí: N'etiti amá ka agēb͕um.
Nuru, gi onwe-gi, nwam, we mara ihe, Me kwa ka obi-gi gazi agazi n'uzọ.
Ihe anọ di nke di ntà n'elu-uwa, Ma ihe ahu mara ihe nke-uku:
Danda bu ndi nādighi ike, Ma ha nēdozi nri-ha na mb͕e okpom-ọku;
Rùe ole mb͕e ka i ganēdina ala, gi onye-ume-ngwu? Òle mb͕e ka i gēsi n'ura-gi bilie?
Ehi mara onye-nwe-ya, inyinya-ibu ma-kwa-ra ebe-ọzùzù-anu nke onye-nwe-ya: ma Israel amaghi, ndim atukwasighi uche.
Ọbuná ub͕ala n'elu-igwe mara mb͕e-ya nile akara àkà; ọzọ, nduru na eleke na okwoli nāriba mb͕e ọbibia-ha ama; ma ndim amaghi ikpé Jehova.
Ma onye-nwe-ya zara, si ya, Ajọ orù nke di ume-ngwu, i matara na anamewe ihe ubi n'ebe m'nāghaghi nkpuru, nāchikọputa kwa n'ebe m'nāfuchaghi;
Lenu anu-ufe nke elu-igwe, na ha adighi-agha nkpuru, ha adighi-ewè kwa ihe-ubi, ha adighi-ekpokọta kwa ihe ba n'ọba; ma Nna-unu nke elu-igwe nāzù ha. Ùnu onwe-unu abughi ihe oké ọnu-ahia kari ha?
n'akuku inu-ọku nke obì-unu, nāgharanu idi ọ̀bọ̀; n'akuku mọ-unu, nādinu ọku; n'akuku Onye-nwe-ayi, nābunu orù;
ka unu we ghara ighọ ndi ume-ngwu, kama ka unu we buru ndi nēṅomi ndi ahu ndi ji okwukwe na ogologo-ntachi-obi nēketa nkwa ahu.