Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 6:23 - Bible Nso

23 N'ihi na oriọna ka ihe ahu enyere n'iwu bu; iwu ahu bu kwa ìhè; Ọ bu kwa uzọ ndu ka iba-nba nile nke idọ-aka-na-nti bu:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Nʼihi na iwu a bụ oriọna, Ihe ozizi a bụkwa ìhè, otu a kwa ịdọ aka na ntị na ịba mba bụ ụzọ ezi ndụ,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 6:23
22 Iomraidhean Croise  

Ma ọ juru, si nwunye nke onye-nwe-ya, Le, onye-nwem amaghi ihe di n'akam n'ulo, ọ bu kwa ihe nile o nwere ka o tiyeworo n'akam;


Okwu-Gi bu oriọna diri ukwum, Ọ bu kwa ìhè diri okporo-uzọm.


Nkpughepu okwu-Gi nile nēnye ìhè; Ọ nēmeka ndi nēnweghi uche ghọta ihe.


Ka onye ezi omume tib͕uem, ọ gābu ebere; Ya ba-kwa-ram nba, ọ gābu manu isi; Ekwela ka isim si, É-è: N'ihi na m'nọ nēkpe ekperem imegide ihe ọjọ ha nile.


Ukpuru nile Jehova tọrọ ziri ezi, nēme ka obi ṅuria ọṅu: Ihe Jehova nyere n'iwu nēnwu enwu, nēnye anya ìhè.


Uzọ iru na ndu ka onye nēdebe idọ-aka-na-nti bu: Ma onye nārapu iba-nba nēme ka madu kpafue.


Uzọ ndu nārigo elu n'ebe onye nwere uche nọ, Ka o we si n'ala-mọ di n'okpuru wezuga onwe-ya.


Nti nke nānu iba-nba nke ndu, N'etiti ndi mara ihe ka ọ gānọ ọnọdu-abali.


Nkpa-n'aka na iba-nba nēnye amam-ihe: Ma nwata nke anārapu n'onwe-ya nēme ka ihere me nne-ya.


Osisi nēnye ndu ka ọ buru ndi nējide ya aka: E, onye ọ bula nke nējisi ya aka ike bu onye ihe nāgara nke-ọma.


Jide idọ-aka-na-nti aka; arala ya aka: Chebe ya; n'ihi na ya onwe-ya bu ndu-gi.


O we zím ihe, sim, Ka obi-gi jide okwum nile; Debe ihe nile m'nyere n'iwu, we di ndu:


I we si, Le ka m'siworo kpọ idọ-aka-na-nti asì nke-uku, Ọ bu kwa iba-nba ka obim leliworo anya;


mu onwem achọtawo kwa ihe di ilu kari ọnwu, bú nwayi ahu nke obi-ya bu ọnyà ọnyà na ub͕u ub͕u, ab͕u ka aka-ya abua bu: onye di nma n'iru Chineke gēsi n'aka nwayi ahu wepuga onwe-ya; ma ọ gānwude onye-nmehie.


Ọ di nma inu ibasi-nba-ike nke onye mara ihe, karia mb͕e madu nānu abù ndi-nzuzu.


Ayi diri iwu, di-kwa-ra ihe-àmà! ọ buru na ha adighi-ekwu dika okwu a si di, n'ezie ọ dighi chi-ọbubọ diri ha.


Ndi nka ka i gāsi kwa, Otú a ka Jehova siri: Le, M'nēche n'iru unu uzọ ndu na uzọ ọnwu.


M'we nye ha ukpurum nile, me ka ha mara ikpém nile, nke madu gādi kwa ndu nime ha, ma o me ha.


Akpọla nwa-nne-gi asi n'obi-gi: i ghaghi ibara madu-ibe-gi nba, ghara ibu nmehie bayere ya.


Eme-kwa-ra ka okwu amuma ahu guzosiere ayi ike kari; nke unu nēme nke-ọma n'iṅa nti ya, dika oriọna mb͕e ọ nēnwu n'ebe b͕ara ọchichiri, rue mb͕e chi gābọ, kpakpando chi-ọbubọ we tibe n'obi-unu:


Ya mere cheta ebe i siworo dapu, gi chèghari kwa, lu kwa ọlu mbu; ma asi na i meghi otú a anamabiakute gi, M'gēwepu kwa ihe-idọba-oriọna-gi n'ọnọdu-ya, ma asi na i chègharighi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan