Ọzọ kwa, Manase wusiri ọbara nke-uku ri nne, bú nke nēmeghi ihe ọjọ, rue mb͕e o mejuru Jerusalem site n'otù ọnu-uzọ-ama rue ọnu-uzọ-ama ọzọ; nāgughi nmehie-ya nke o jiri me ka Juda mehie, ime ihe jọrọ njọ n'anya Jehova.
Ọ maghi nma n'ebe onye-nzuzu nọ, bú eb͕ub͕ere-ọnu nēkwu ihe makarisiri nma: Èb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwu okwu-ugha gēsi kwa aṅa ma nma n'ebe onye amara aha-ya nọ?
Jehova we si, N'ihi na umu-ndinyom Zaion di npako, nēwere kwa olu setiri eseti na anya nāràrá ndikom ejeghari, nārọ nma mb͕e ha nējeghari, nēwere kwa ukwu-ha eme ka ọla-ukwu-ha da udà:
Nmata ha nāmata iru madu n'ikpe azawo megide ha; nmehie-ha ka ha gosiwo-kwa-ra dika Sọdọm, ha ezobeghi ya. Ahuhu gādiri nkpuru-obi-ha! n'ihi na ha emesowo onwe-ha ihe ọjọ.
Nání, maranu nke-ọma na, ọ buru na unu eme ka m'nwua, ọbara nke nēmeghi ihe ọjọ ka unu onwe-unu nātukwasi n'aru unu, na n'aru obodo a, na n'aru ndi bi ya: n'ihi na n'ezi-okwu Jehova ezitewom ibiakute unu ikwu okwu ndia nile na nti-unu.
Unu onwe-unu sitere na nna-unu, bú ekwensu, ọ bu kwa ihe nāgu nna-unu ka unu nāchọ ime. Onye ahu bu ob͕u-madu site na mbu, o guzoghi kwa n'ezi-okwu, n'ihi na ezi-okwu adighi nime ya. Mb͕e ọ bula ọ nēkwu okwu-ugha, ọ nēkwu ihe si n'ihe nke aka ya puta: n'ihi na ọ bu onye-ugha, buru kwa nna-ya.
Otú ahu, unu ndi bu nwata, donu onwe-unu n'okpuru ndi-okenye. Ma unu nile were obi di ume-ala ke onwe-unu dika ákwà, ijerita ibe-unu ozi: n'ihi na Chineke nēdo Onwe-ya imegide ndi-npako, ma Ọ nēnye ndi di ume-ala n'obi amara.
N'azu obodo ka ha di, bú nkita nile, na ndi nile nāgwọ nsi, na ndi nile nākwa iko, na ndi-ob͕u-madu nile, na ndi nēkpere arusi, na onye ọ bula nke nāhu ugha n'anya nēme kwa ya.