10 Nwa ura ntà, nwa irù-ura ntà, Nwa ikpakọba-aka ntà idina ala;
10 Nwa ụra nta, nwa iru ụra nta, nwa ịchịkọba aka nta zuo ike,
Ume-ngwu nēme ka oké ura dakwasi madu; Ọ bu kwa nkpuru-obi nke di ume-ngwu ka agu nāgu.
Ahula urá n'anya, ka ewe ghara inapu gi ihe nile; Meghe anya-gi abua, rijue nri afọ.
N'ihi na onye nāṅubiga manya ókè na onye nēribiga ihe ókè ka agānapu ihe nile: Ọ bu kwa nkirika ákwà ka òrù-ura gēyikwasi madu.
Jekuru ndanda, onye-ume-ngwu; Le uzọ-ya nile, we mara ihe:
Rùe ole mb͕e ka i ganēdina ala, gi onye-ume-ngwu? Òle mb͕e ka i gēsi n'ura-gi bilie?
Onye-nzuzu nākpakọba aka-ya abua, nēri kwa anu-aru onwe-ya.