Ha bu okwu ire-utọ, bú okwu ọnu-ya nke di ka miri-ara raru araru, Ma nání agha ka obi-ya bu: Okwu-ya nile di nrò kari manu, Ma okwu ahu bu mma-agha amiputara amiputa.
mu onwem achọtawo kwa ihe di ilu kari ọnwu, bú nwayi ahu nke obi-ya bu ọnyà ọnyà na ub͕u ub͕u, ab͕u ka aka-ya abua bu: onye di nma n'iru Chineke gēsi n'aka nwayi ahu wepuga onwe-ya; ma ọ gānwude onye-nmehie.
N'ihi na okwu Chineke di ndu, nālusi kwa ọlu ike, di kwa nkọ kari mma-agha ọ bula nke nwere iru abua, nādu kwa rue n'ikewa nkpuru-obi na mọ, ma njikọta ma umi, buru kwa ihe nwere ike ituputa èchichè na izù nile nke obi.