Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 5:21 - Bible Nso

21 N'ihi na n'iru anya Jehova ka uzọ nile nke madu di, Okporo-uzọ-ya nile ka Ọ nēme ka ha di lari.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Nʼihi na Onyenwe anyị na-ele gị anya, ihe niile ị na-eme ka ọ na-ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 5:21
21 Iomraidhean Croise  

N'ihi na Jehova, anya-Ya nējeghari n'uwa nile, igosi Onwe-ya onye di ike n'akuku ndi obi-ha zuru okè n'ebe Ọ nọ. I bu onye-nzuzu na nka; n'ihi na site n'ub͕u a i gēnwe agha.


N'ihi na ubu a I nāgu nzọ-ukwum ọnu: Ì dighi-elezi nmehiem anya?


Chineke nēme ka ọ nọ na ntukwasi-obi, ọ nādabere kwa na ya; Ma anya-Ya dikwasi n'uzọ nile ha.


Yà onwe-ya adighi-ahu uzọm nile, Gu kwa nzọ-ukwum nile ọnu?


N'ihi na anya-Ya dikwasi uzọ nile nke madu, Nzọ-ukwu-ya nile ka Ọ nāhu kwa.


Jehova nọ n'ulo uku Ya di nsọ, Jehova, n'elu-igwe ka oche-eze-Ya di; Anya-Ya nāhu, mbubere-anya-Ya nānwa, umu madu.


Edebewom ihe-iriba-ama-Gi nile na ihe-àmà-Gi nile; N'ihi na uzọm nile di n'iru Gi.


I nwawo obim; I letawom n'abali; I nuchawom, ma I dighi-achọputa ihe; Ezubewom na ọnum agaghi-agabiga ókè.


N'ebe nile ọ bula ka anya abua nke Jehova di, Nēche ndi ọjọ na ndi bu ezi madu nche.


Me ka okporo-uzọ nke ukwu-gi abua di lari, Ka edozi kwa uzọ-gi nile.


Ka i we ghara ime ka okporo-uzọ ndu di lari: Uzọ-ya nile emewo nkpatu, i gaghi-ama ha.


N'ihi na anyam abua dikwasi n'uzọ nile ha: ezopughi ha n'irum, ezobeghi kwa ajọ omume-ha pua n'iru anyam abua.


Mu onwem, bú Jehova, nēnyocha obi, nānwa akuru, ọbuná inye onye ọ bula dika uzọ-ya nile si di, dika nkpuru nke omume-ya nile si di.


Ọ̀ di onye ọ bula gēzobe onwe-ya n'ebe ọ bula di nzuzo, Mu onwem we ghara ihu ya anya? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Ọ̀ bughi elu-igwe na uwa ka M'juputara? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


n'ihi na ha emewo ihe-nzuzu n'Israel, we kwa nwunye ndikom-ibe-ha iko, kwu kwa okwu n'aham n'ugha, bú nke M'nēnyeghi ha n'iwu; ma Mu onwem bu onye mara, na onye-àmà; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


I di uku na ndum-ọdu, di kwa ike n'omume: Onye anya-Gi ghere oghe ilekwasi uzọ nile nke umu madu; inye onye ọ bula dika uzọ-ya nile si di, na dika nkpuru omume-ya nile si di:


Ma ha adighi-asi n'obi-ha na ọ bu ihe ọjọ nile ha ka M'chetaworo: ub͕u a ka omume nile ha b͕aworo ha buruburu; na ncherita-irum ka ha di.


Ọ dighi kwa ihe ekère èkè nke nāputaghi ihè n'iru Ya: kama ihe nile b͕a ọtọ buru kwa ihe emegheworo n'anya-Ya, bú Onye ayi gākọrọ akukọ bayere omume-ayi.


Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Taiataira akwukwọ, si, Ihe ndia ka Ọkpara Chineke nēkwu, Onye anya-Ya abua di ka ire ọku, ukwu-Ya abua di kwa ka ọla akwọchapuru ka o b͕upu:


M'gēwere kwa ọnwu b͕ue umu-ya; nzukọ Kraist nile gāmara kwa na Mu onwem bu onye nēnyocha akuru na obi nile: M'gēnye kwa unu n'otù n'otù dika ọlu nile unu si di.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan