Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 5:16 - Bible Nso

16 Isi-iyi-gi, hà gāwasasi n'èzí? Ọ̀ bu n'amá ka iyi miri gāwasasi?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Gịnị mere ị ga-eji kwe ka isi mmiri gị sọọ nʼokporoụzọ, ka mmiri nke aka gị sọọ nʼama?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 5:16
13 Iomraidhean Croise  

Ha we gọzie Rebeka, si ya, Nwa-nne-ayi, gi onwe-gi ghọ nnù kwuru nnù madu, ọzọ, ka nkpuru-gi nweta ọnu-uzọ-ama nke ndi nākpọ ha asì.


Le, ihe-nketa nke nēsi n'aka Jehova bia ka umu bu: Ugwọ-ọlu Ọ nākwu ka nkpuru nke afọ bu.


Nwunye-gi gādi ka osisi vine nāmi nkpuru n'ime-ime-ulo nke ulo-gi: Umu-gi gādi ka ome osisi oluve buruburu table-gi.


Nime nkpọkọta nile nke madu gọzienu Chineke, Bú Onye-nwe-ayi, unu ndi sitere n'isi-iyi Israel.


Ṅua miri sitere n'olùlù nke aka gi, Na miri nērù erù site n'ime olùlù-miri nke aka gi.


Ka ha diri nání gi onwe-gi, Ma ka ndi nābughi ndi nke gi ghara isoro gi nwe ha.


Ka isi-iyi-gi buru ihe agọziri agọzi; Ṅuri kwa ọṅu na nwunye i luru n'okorọbia.


Miri ezutara ezuta nātọ utọ, Nri eriri na nzuzo di utọ.


Ubi ab͕ara ogige nke akpachiri akpachi ka nwa-nnem nwayi, bú nwunye ọhu nkem, bu; Ebe-nsuputa-miri akpachiri akpachi, isi-iyi ab͕achiri ab͕achi.


Isi-iyi nke ubi nile ab͕ara ogige ka i bu, Olùlù-miri nke juputara na miri di ndu, Na miri-iyi di iche iche nke nērù erù site na Lebanon.


Akpiri akpọghi ha nku mb͕e O mere ka ha je ije n'ala kpọrọ nku: O mere ka miri si n'oké nkume rùputara ha: e, Ọ kpọwara oké nkume, miri we suputa.


Israel we biri na ntukwasi-obi, Isi-iyi Jekob nání ya iche, N'ala ọka na manya-vine ọhu; Ọzọ, elu-igwe-ya nātasi igirigi.


O nwe-kwa-ra orú umu-ndikom na iri ọ muru, ọ bu kwa orú umu-ya ndinyom na iri ka o zipuru n'èzí, orú ndinyom na iri ka o me-kwa-ra ka ha si n'èzí batara umu-ya ndikom. O we kpe Israel ikpe arọ asa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan