Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 4:7 - Bible Nso

7 Isi ihe ka amam-ihe bu; nweta amam-ihe: E, were ihe nile i nwetaworo nweta nghọta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Mmalite amamihe bụ nke a, nweta amamihe, ihe ọbụla o ga-efu gị, nweta nghọta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 4:7
18 Iomraidhean Croise  

Ub͕u a nyem amam-ihe na ihe-ọmuma, ka m'we nāpu apu nābata kwa abata n'iru ndi nka: n'ihi na ònye gēkpe ndi-Gi nka di uku ikpe?


M'nēsitei n'ihe-iriba-ama-Gi nile ghọta ihe: N'ihi nka ka m'kpọworo uzọ okwu-ugha ọ bula asì.


Inweta amam-ihe, le ka o si di nma nke-uku kari ọla-edo ọma! Inweta nghọta kwa, le ka o si buru ihe anārọputa nke-uku kari ọla-ọcha!


Ọ buru na i chọ ya dika ọla-ọcha, Ọ buru kwa na ọ bu dika àkù zoro ezo ka i nēgwuputa ya:


Ikpa àkù site n'ire okwu-ugha Bu otù nku-ume anēfesa n'ifufe; ndi nāchọ àkù ahu nāchọ ọnwu.


Zuta ezi-okwu, ere-kwa-la ya; E, amam-ihe, na idọ-aka-na-nti, na nghọta.


Nweta amam-ihe, nweta nghọta; Echezọla, esi-kwa-la n'okwu nile nke ọnum wezuga onwe-gi:


Site na mb͕e ebighi-ebi ka emerem ka m'guzosie ike, site n'isi-mbu, Tutu uwa adi.


Ọ di otù onye nke nání ya di, ọ dighi kwa onye abua ọ nwere; ọ dighi kwa nwa ma-ọbu nwa-nne o nwere; ma ọ dighi nsọtu diri ndọb͕u-ya nile ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, afọ adighi-eju kwa anya-ya n'àkù. Ọ nāsi, Ọ̀ bu kwa n'ihi onye ka mu onwem nādọb͕u onwem n'ọlu, we me ka ezi ihe kọnari nkpuru-obim? Nka bu kwa ihe-efu, e, nweda-n'ala jọrọ njọ ka ọ bu.


N'ihi na amam-ihe bu ǹdò, ego bu kwa ǹdò: ma ọkaka nke ihe-ọmuma bu, na amam-ihe nēme ka onye-nwe-ya di ndu.


ma otu ihe bu ihe di nkpà: n'ihi na Meri rọputara ezi òkè ahu, nke anāgaghi-anapu ya.


Ma Chineke siri ya, Onye nēnweghi uche, n'abali a ka anāchọ mkpure-obi-gi n'aka-gi; ma ihe i doziri, ònye gēnwe ha?


E, tukwasi kwa, anamagu kwa ihe nile n'ihe-iyì n'ihi ọkika nke ọmuma Kraist Jisus, bú Onye-nwem: Onye m'yiri iyì ihe nile nkem n'ihi Ya, anamagu kwa ha n'ihe-nkpofu, ka m'we rita Kraist n'urù,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan