27 Ewezugala onwe-gi n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe: Si n'ihe ọjọ wezuga ukwu-gi.
27 Ewezugala onwe gị site nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe; si nʼihe ọjọọ wezuga ụkwụ gị.
Nwam, esola ha je n'uzọ; B͕ochie ukwu-gi n'iga n'okporo-uzọ-ha:
Uzọ atuliri atuli nke ndi ziri ezi bu isi n'ihe ọjọ wezuga onwe-ha: Onye nēdebe nkpuru-obi-ya nēche uzọ-ya.
Sanu aru, menu onwe-unu ka unu di ọcha; wezuganu ihe ọjọ nke omume-unu nile n'iru anyam abua; rapunu ime ihe ọjọ:
Ka ihu-n'anya buru ihe nke iru-abua nādighi nime ya. Nākpọnu ajọ ihe asì; nārapara ezi ihe n'aru.
Ihe ọ bula nke mu onwem nēnye unu n'iwu, nke ahu ka unu gēlezi anya ime: atukwasila ihe n'elu ya, agubì-kwa-la ihe nime ya.
ma ewezugala onwe-gi n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe n'okwu nile ọ bula nke mu onwem nēnye unu n'iwu ta, ijeso chi di iche iche ọzọ ifè ha òfùfè.
Unu gēlezi kwa anya ime dika Jehova, bú Chineke-unu, nyeworo unu iwu: unu ewezugala onwe-unu n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe.
Nání, di ike, nwe kwa ume nke-uku, ilezi anya ime dika iwu ahu nile si di, nke Moses, bú orùm, nyere gi n'iwu: ewezugala onwe-gi na ya n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe, ka i we nwe uche n'ebe ọ bula i nēje.