21 Ekwela ka ha si n'anya-gi abua wezuga onwe-ha; Debe ha n'etiti obi-gi.
21 Doo ihe ndị a nʼuche gị mgbe niile; ka ha bamiekwa nʼime obi gị,
Ime ihe di Gi utọ atọwom utọ, Chineke; Iwu-Gi di kwa nime obim.
Nwam, ọ buru na i nara okwu-ọnum nile, Ọ buru kwa na i zobe ihe nile m'nyere n'iwu n'ebe i nọ;
N'ihi na ọ di utọ mb͕e i debe ha n'afọ-gi, Mb͕e ha gēguzosi ike n'otù n'elu eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua.
Nwam, echezọla iwum; Ma ka obi-gi chebe ihe nile m'nyere n'iwu:
Nwam, ekwela ka ha si n'anya-gi abua wezuga onwe-ha; Chebe nzube-ihe na ìzùzù;
Ekwela ka ebere na ezi-okwu rapu gi: Ke ha n'olu-gi; De ha n'elu mbadamba nkume, bú obi-gi:
Hie ha n'obi-gi mb͕e nile, Ke ha n'olu-gi.
Ke ha na nkpisi-aka-gi nile; De ha n'elu mbadamba nkume, bú obi-gi.
Nání lezie onwe-gi anya, debe kwa nkpuru-obi-gi nke-ọma, ka i ghara ichezọ ihe nile nke anya-gi abua huworo, ka ha ghara kwa isi n'obi-gi wezuga onwe-ha ubọchi nile nke ndu-gi; kama gi me ka umu-gi na umu umu-gi mara ha;