Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 4:2 - Bible Nso

2 N'ihi na ezi ihe-nmuta ka m'nyeworo unu; Unu arapula iwum.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ṅaanụ ntị, nwee uche, nʼihi na ọ bụ ezi ozizi ka m na-ezi unu; ya mere, unu ahapụkwala iwu m.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 4:2
15 Iomraidhean Croise  

Ma gi onwe-gi, Solomon nwam, mara Chineke nke nna-gi, were obi zuru okè, were kwa nkpuru-obi ọ nātọ utọ, fè Ya òfùfè: n'ihi na nkpuru-obi nile ka Jehova nēnyocha, Ọ nāghọta kwa nchèputa nile ọ bula nke èchìchè: ọ buru na i chọ Ya, Ọ gēme ka i chọta Ya; ma ọ buru na i rapu Ya, Ọ gāju gi rue mb͕e ebighi-ebi.


Ma ọ buru na unu onwe-unu alaghachi azu, we rapu ukpurum nile na ihe nile M'nyere n'iwu, nke M'tiyeworo n'iru unu, unu we je fè chi ọzọ òfùfè, kpọ isi ala nye ha:


I we si, Nmutam di ọcha, M'di kwa ọcha n'anya-Gi.


Okwu-ọnum nile gēkwuputa izi-ezi nke obim: Ihe eb͕ub͕ere-ọnum mara ka ha kwuworo n'idi-ọcha.


Ọ fọduru nwantī ka ha me ka m'gwusia n'uwa; Ma mu onwem arapughi ihe-iriba-ama-Gi nile.


Nwam, echezọla iwum; Ma ka obi-gi chebe ihe nile m'nyere n'iwu:


Ayi we ge nti olu Jonadab nwa Rikab, bú nna-ayi, n'ihe nile nke o nyere ayi n'iwu, ighara iṅu manya-vine ubọchi nile ayi, ayi onwe-ayi, na ndinyom-ayi, na umu-ayi ndikom, na umu-ayi ndinyom;


Nmutam gātasi dika miri-ozuzo, Okwu-ọnum ganēruputa dika igirigi; Dika nshansha-miri n'elu ahihia ndu, Di kwa ka oké miri-ozuzo n'elu ihe-ọkukú:


Ọ buru na i me ka umu-nna-ayi nēchè uche n'ihe ndia, i gābu onye nējere Kraist Jisus ozi nke-ọma, ebe anāzùputa gi n'okwu nile nke okwukwe-ayi, na nke ozizí ọma ahu nke i soworo n'ukwu n'ukwu:


nējide okwu ahu nke kwesiri ntukwasi-obi nke di ka ozizí-ayi si di, ka o we pu idusi ọdu ike nime ozizí nke nēnye ezi ndu, na itu kwa ndi nēkwugide ekwugide nmehie-ha n'anya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan