Ahuhu gādiri ndi nākpọ ihe ọjọ ezi ihe, ndi nākpọ kwa ezi ihe ihe ọjọ; ndi nētiye ọchichiri n'ọnọdu ìhè, na ìhè n'ọnọdu ọchichiri; ndi nētiye ihe ilu n'ọnọdu ihe utọ, na ihe utọ n'ọnọdu ihe ilu!
Lezienu anya, onye ọ bula onye-ab͕ata-obi-ya, unu atukwasi-kwa-la nwa-nne ọ bula obi: n'ihi na nwa-nne ọ bula nējidesi ikiri-ukwu nwa-nne-ya ike, ọzọ, onye-ab͕ata-obi ọ bula nējeghari nāb͕a àmà ọjọ.
Okwu di otú a ka Jehova kwuru bayere ndi-amuma ahu ndi nēdufu ndim; ndi ji ezé-ha ata aru, we kpọ, si, Udo; ma onye ọ bula nke nādighi-etiye ihe n'ọnu-ha, ha ewe do agha nsọ megide ya;
Ọ bu n'elu ihe ọjọ ka ọbu-aka-ha abua di ime ya nke-ọma; onye-isi nāriọ, onye-ikpe ewe jikere n'ihi ugwọ; onye uku kwa, onye nēkwu ihe-ila-n'iyì nke nkpuru-obi-ya ka ọ bu: ha we tukọta ya dika udọ̀.
Ma ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nēmechi uzọ ala-eze elu-igwe n'iru madu: n'ihi na unu onwe-unu abataghi, unu adighi-ekwe kwa ndi nābata ka ha bata.