Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 4:15 - Bible Nso

15 Zere ya, agabigala nime ya; Wezugara ya onwe-gi, gabiga.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Zeere ha, ejekwala nʼụzọ ha; chepu ihu gị nʼụzọ ahụ,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 4:15
12 Iomraidhean Croise  

Ọ buru na ajọ ihe adi n'aka-gi, me ka ọ di n'ebe di anya, Ekwe-kwa-la ka ajọ omume biri nulo-ikwū-gi nile;


Ọ buru na i laghachikute Onye puru ime ihe nile, agēwuli gi elu dika ulo; I gēme ka ajọ omume di anya n'ebe ulo-ikwū-gi nile di.


I gānọpuru okwu-ugha n'ebe di anya; eb͕u-kwa-la onye ikpé nāmaghi na onye ezi omume: n'ihi na adighm-agu onye nēmebi iwu n'onye ezi omume.


Nwam, esola ha je n'uzọ; B͕ochie ukwu-gi n'iga n'okporo-uzọ-ha:


Ekwosola ndi ọjọ ekworo, Achọsi-kwa-la ike inọ n'etiti ha:


Abàla n'okporo-uzọ ndi nēmebi iwu, Aga-kwa-la n'iru n'uzọ ndi ọjọ.


N'ihi na ha adighi-araru ura, ọ buru na ha adighi-eme ihe ọjọ; Anapuwo kwa ura-ha n'ike, ọ buru na ha adighi-eme ka madu su ngọngọ.


Me ka uzọ-gi di anya n'ebe ọ nọ, Abiaru-kwa-la ọnu-uzọ ulo-ya nso:


Naputa onwe-gi dika mb͕ada n'aka onye-ntá, Na dika nnunu n'aka osi-ọnyà.


Ọ bu onye nējeghari n'ezi omume nile, nke nēkwu kwa okwu nile ziri ezi; nke nāju urù nmeb͕u nile, nke nētichapu ọbu-aka-ya abua n'ijide ihe-iri-ngo, nke nākwuchi nti-ya abua ka ọ ghara inu okwu bayere iwusi ọbara, nke nātachi kwa anya-ya abua ka ọ ghara ilekwasi ihe ọjọ anya;


unu esola ọlu nke ọchichiri nke nāmighi nkpuru nēnwekọ ihe, ma kama nke ahu nātu-kwa-nu ha nmehie-ha n'anya;


unu etiyela aka n'aha ajọ ihe ọ bula.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan