14 Abàla n'okporo-uzọ ndi nēmebi iwu, Aga-kwa-la n'iru n'uzọ ndi ọjọ.
14 Emela dịka ndị na-emebi iwu. Esokwala ụzọ ha.
Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu nke nējeghi ije na ndumọdu ndi nēmebi iwu, Nke nēguzoghi kwa n'uzọ ndi nmehie, Nke nānọghi kwa n'ọnọdu ndi nākwa emò.
Nwam, ọ buru na ndi-nmehie arà gi urà, Ekwela.
Nwam, esola ha je n'uzọ; B͕ochie ukwu-gi n'iga n'okporo-uzọ-ha:
Nējeso ndi mara ihe, i gāma kwa ihe: Ma eyì ndi-nzuzu ka agēmejọ.
Ka i we ghara imuta uzọ-ya nile, We wetara nkpuru-obi-gi ọnyà.
Ekwosola ndi ọjọ ekworo, Achọsi-kwa-la ike inọ n'etiti ha:
Zere ya, agabigala nime ya; Wezugara ya onwe-gi, gabiga.
Me ka uzọ-gi di anya n'ebe ọ nọ, Abiaru-kwa-la ọnu-uzọ ulo-ya nso:
Ka ọ nāgabiga n'amá na nso nkuku nwanyi ahu, Ọ bu kwa n'uzọ ulo-ya ka ọ nāzọ ije;
Rapunu amaghi-ihe, unu ndi nēnweghi uche, we di ndu; Ga-kwa-nu n'iru n'uzọ nghọta.
Unu ekwela ka eduhie unu: Nkparita nile ọjọ nēmebi omume ọma.