Sọpuru nna-gi na nne-gi, dika Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi iwu: ka ubọchi-gi we di anya, ka ọ we di-kwa-ra gi nma, n'elu ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.
ka i we tua egwu Jehova, bú Chineke-gi, idebe ukpuru-Ya nile na ihe nile O nyere n'iwu, nke Mu onwem nēnye gi n'iwu, gi onwe-gi, na nwa-gi, na nwa nwa-gi, ubọchi nile nke ndu-gi; ka ubọchi-gi we di kwa anya.
Ọ bu kwa n'ihi nka ka ayi onwe-ayi nēkele kwa Chineke nēwepughi aka, na, mb͕e unu natara okwu nke unu nuru n'ọnu-ayi, bú okwu nke Chineke, ọ bughi okwu madu ka unu nara nke-ọma, kama, otú ọ di n'ezi-okwu, ọ bu okwu Chineke, nke nālusi kwa ọlu ike nime unu ndi kwere ekwe.
Okwu a kwesiri ntukwasi-obi, kwesi kwa ka anara ya nke-ọma n'uzọ nile ọ bula, na Kraist Jisus biara n'uwa izọputa ndi-nmehie; ndi mu onwem bu onye-isi-ha: