1 Umum, nurunu idọ-aka-na-ntí nke nna, Tọ-kwa-nu nti n'ala ima nghọta:
1 Ụmụ m ndị ikom, geenụ ntị na ndụmọdụ nke nna unu, lezienụ anya ka unu nwee nghọta.
Zukọnu, nukwanu, umu-ndikom Jekob; Genu nti n'olu Israel, bú nna-unu.
Bianu, umum, gem nti: Egwu Jehova ka m'gēzi unu.
Ima amam-ihe na idọ-aka-na-nti; Ighọta okwu-ọnu nile nke nghọta;
Nwam, nuru idọ-aka-na-nti nke nna-gi, Arapu-kwa-la iwu nne-gi:
Nwa nke mara ihe nānu idọ-aka-na-nti nna-ya: Ma onye nākwa emò anughi ibasi-nba-ike.
Nuru ndum-ọdu, nara kwa idọ-aka-na-nti, Ka i we mara ihe n'ikpe-azu-gi.
Tọ nti-gi n'ala, nu okwu nile nke ndi mara ihe, Tukwasi kwa obi-gi n'ihe-ọmumam.
Nwam, ṅa nti n'amam-ihem; Tọ nti-gi n'ala nye nghọtam:
Si amam-ihe, Nwa-nnem nwanyi ka i bu; Kpọ kwa nghọta nwanyi i mara nke-ọma:
Ayi we ge nti olu Jonadab nwa Rikab, bú nna-ayi, n'ihe nile nke o nyere ayi n'iwu, ighara iṅu manya-vine ubọchi nile ayi, ayi onwe-ayi, na ndinyom-ayi, na umu-ayi ndikom, na umu-ayi ndinyom;
N'ihi nka ayi aghaghi iṅabiga nti ókè kari n'ihe anuru, ka aghara ibupu ayi n'ebe ha di ma eleghi anya, dika miri nēbupu ub͕ọ.