7 Ihe abua ka m'riọworo Gi; Ajulam ha tutu mu anwua:
7 “O Onyenwe anyị, naanị ihe abụọ ka m na-arịọ gị tupu m nwụọ; ajụkwala imere m ha:
O rue, mb͕e ha gabigasiri, na Elaija siri Elaisha, Riọ ihe m'gēmere gi, tutu ewepum n'ebe i nọ. Elaisha we si, Biko, ka òkè abua nke mọ-gi dikwasim.
Ọ bu ihe obi-ya nāchọsi ike ka I nyeworo ya, I b͕ochighi kwa arirọ eb͕ub͕ere-ọnu-ya. Selah
Otù ihe ka m'riọworo n'aka Jehova, nke ahu ka m'nāchọ; Ọ bu ka m'biri n'ulo Jehova ubọchi nile nke ndum, Ihu idi-utọ Jehova, na ijuta ihe n'ulo uku Ya.
Atukwasila ihe n'okwu-Ya nile, Ka O we ghara ibara gi nba, i we ghọ onye-okwu-ugha.
Me ka ihe-efu na okwu-ugha di anya n'ebe m'nọ: Enyelam ọnọdu-ob͕eye ma-ọbu àkù; Me ka m'rie nri rurum:
ma otu ihe bu ihe di nkpà: n'ihi na Meri rọputara ezi òkè ahu, nke anāgaghi-anapu ya.