Nwa nke madu, buliere Fero, bú eze Ijipt, abù-ákwá, si ya, Nwa-ọdum nke mba nìle ka i yiworo: ma gi onwe-gi di ka ogologo anu n'oké osimiri nile; i we waputa n'osimiri-gi nile, ji ukwu-gi, b͕arua miri, zọrua osimiri nile ha.
Ndi Jekob fọduru gādi kwa n'etiti mba nile, n'etiti ọtutu ndi di iche iche, dika ọdum n'etiti anumanu nke oké ọhia, dika nwa-ọdum n'etiti ìgwè ewu na aturu nile: nke gābu, mb͕e ọ gāgabiga, ọ gāzọda, dọkasia, ọ dighi kwa onye-nnaputa di.
Ndikom obdo ahu we si ya n'ubọchi nke-asa tutu anyanwu ada, Gini di utọ kari manu-aṅu? ma-ọbu gini di ike kari ọdum? O we si ha, Ọ buru na unu ejighi nwa-ab͕ọghọ-ehim dọ ihe eji gwu ala-ubi, Unu agaghi-achọtawori ilum.