M'we si, Ahuhu nādirim, n'ihi na alawom n'iyì; n'ihi na onye eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ruru árú ka m'bu, ọ bu kwa n'etiti ndi eb͕ub͕ere-ọnu-ha ruru árú ka m'nēbi: n'ihi na ọ bu Eze-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, ka anyam abua huworo.
Nání anu-ọhia ka madu ọ bula ghọworo site n'ihe-ọmuma-ya; emewo ka ihere me onye-nnucha-ọla ọ bula site n'arusi-ya apiri api: n'ihi na okwu-ugha ka arusi-ya awuru awu bu, nku-ume adighi kwa nime ha.
N'ihi na achọghm ka unu ghara ima ihe-omimi a, umu-nnam, ka unu ghara inwe uche n'anya onwe-unu, na emewo Israel obi-etili ufọdu, rue mb͕e ozùzù ndi mba ọzọ gābata;
Ka onye ọ bula ghara ighọb͕u onwe-ya. Ọ buru na onye ọ bula nēchè na ya bu onye mara ihe n'etiti unu n'oge a, ya ghọ onye-nzuzu, ka o we ghọ onye mara ihe.
Ma ọ buru na amam-ihe fọduru onye ọ bula nime unu inwe, ya riọ n'aka Chineke, Onye nēnye madu nile n'afọ-ofufọ, nātaghi kwa uta; agēwere kwa ya nye ya.