Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 30:14 - Bible Nso

14 Ọb͕ọ di, mma-agha ka ezé nile ha bu, ọ bu kwa mma ka ikiri-ezé-ha bu, Irichapu ndi ewedara n'ala n'uwa, na irichapu ndi-ob͕eye n'etiti madu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Ndị eze ha niile bụ mma agha ịkịrị eze ha bụkwa mma maka irichapụ ndị ogbenye site nʼụwa na ndị nọ nʼụkọ site nʼetiti mmadụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 30:14
33 Iomraidhean Croise  

M'we tijie ikiri-ezé nke onye ajọ omume, Si n'ezé-ya tupu anu ọ dọb͕uru.


Ònye gēmeghe uzọ nke iru-ya? Ezé-ya di oké ujọ buruburu.


N'ihi ipunara ndi ewedara n'ala ihe, n'ihi isu-ude nke ndi-ob͕eye, Ub͕u a ka M'gēbili, ka Jehova kwuru; M'gēdo ya na nzọputa nke o nēkusi ume ike inwe.


Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, Onye nēnyeghi ayi iburu ezé-ha anu-ndọb͕u.


Ndi nile nālu ajọ ihe, hà amaghi ihe? Bú ndi riworo nri site na-iri ndi m, Ma ha akpọkughi Jehova.


Bilie, Jehova; zọputam, Chinekem: N'ihi na I tiwo ndi-irom nile ihe na ǹtì; I tipiawo ezé ndi nēmebi iwu.


Ihe-ila-n'iyì di iche iche ka ire-gi nēchè; Dika aguba di nkọ, nālu ọlu aghughọ.


Nkpuru-obim nọ n'etiti ọdum; M'gēdina n'etiti ndi nēre ọku, Bú umu madu, ndi ezé nile ha bu ube na àkú, Ire-ha bu kwa mma-agha di nkọ.


Me Onwe-gi ka I di elu n'elu elu-igwe nile, Chineke; Ka ebube-Gi di elu n'elu uwa nile.


Chineke, tijie ezé nile ha n'ọnu-ha: Tikwopu ezé uku nile nke umu-ọdum, Jehova.


O nwere onye nēkwu okwu nēchèghi echè dika ndupú nke mma-agha: Ma ire ndi mara ihe bu ihe nāgwọ madu.


Onye nēmeb͕u onye nēnweghi ike ime ka àkù nke aka ya ba uba, Ya na onye nēnye ọgaranya ihe gābiaru nání ihe-ukọ.


Nwoke bu ob͕eye nke nēmeb͕u ndi nēnweghi ike, Ọ di ka miri-ozuzo nke nāzachapu ihe, nri we ghara idi.


Etu nwere umu abua, nāsi, Nye, nye. Ihe atọ di nke afọ nādighi-eju, E, anọ di nke nāsighi, O b͕owo:


Mu onwem we legharia anya bu nmeb͕u nile anēmeb͕u n'okpuru anyanwu: ma, le, anya-miri nke ndi anēmeb͕u, ma ọ dighi onye-nkasi-obi ha nwere; ma n'akuku ndi nēmeb͕u ha ka ike di, ma ọ dighi onye-nkasi-obi ha nwere.


iwezuga ndi nēnweghi ike n'ezi ikpé, na inapu ikpé ziri ezi nke ndi ewedara n'ala nke ndim, ka ndinyom di-ha nwuru we buru ihe ha kwatara n'agha, ka ha we luta kwa ihe umu-nb͕ei n'agha!


Jehova gēso ndi-okenye nke ndi-Ya na ndi-isi-ha ba n'ikpé, si, Ma unu onwe-unu, unu eripiawo ubi-vine; ihe unu napuworo onye ewedara n'ala n'ike di n'ulo-unu nile:


gini mere unu ji azọpia ndim, gwepia kwa iru onye ewedara n'ala? ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, puta.


Ihe-ọlu nile nke onye-aghughọ jọ-kwa-ra njọ: onye ahu ezubewo ihe-nzube ọjọ di iche iche iji okwu-ọnu nile nke bu okwu-ugha mebie ndi ewedara n'ala, ọbuná mb͕e ob͕eye nēkwu okwu ikpé ziri ezi.


Le, ndi-isi Israel, onye ọ bula ka ogwe-aka-ya ra, anọwo nime gi iwusi ọbara.


Abuba-ha ka unu nēri, aji-ha ka unu nēyi, anu nke mara abuba nime ha ka unu nēb͕u; ma ìgwè ewu na aturu ka unu nāzùghi.


ha bu ndi nēghekpọso ájá ala n'isi ndi nēnweghi ike, ọ bu kwa uzọ ndi di ume-ala n'obi ka ha nēwezuga: ọzọ, nwoke na nna-ya nējekuru otù nwa-ab͕ọghọ ahu, ka ha we me ka aha nsọm ghara idi nsọ:


Nurunu okwu a, unu nne-ehi nke Beshan, ndi nọ n'ugwu Sameria, ndi nēmeb͕u ndi nēnweghi ike, ndi nāzọpia umu-ob͕eye, ndi nāsi ndi-nwe-ha, Wetanu, ka ayi ṅua.


Nurunu nka, unu ndi nēkusi ume ike ilo ob͕eye, ndi nāchọ kwa ime ka ndi ala-unu ewedara n'ala kwusi,


I jiwo nkpa-n'aka-ya dupue ndi-agha-ya isi: Bú ndi nābia dika oké ifufe ifesam: Obi-utọ-ha di ka agāsi na ha gaje iripia onye ewedara n'ala n'ebe-nzuzo.


Ndi-isi-ya n'etiti ya bu ọdum nāb͕ọ uja; ndi-ikpe-ya bu anu-ọhia wolf nke anyasi; ha ekpechaghi ọkpukpu n'ututu.


Ma ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nēmechi uzọ ala-eze elu-igwe n'iru madu: n'ihi na unu onwe-unu abataghi, unu adighi-ekwe kwa ndi nābata ka ha bata.


Ha nwe-kwa-ra agiri-isi dika agiri-isi ndinyom, ezé-ha di kwa ka ezé ọdum.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan